LEVITIKỌS 11:12-18
LEVITIKỌS 11:12-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe ọbụla bi nʼime mmiri nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha, bụ nke unu ga-asọ asọ. “ ‘Ndị a bụ nnụnụ ndị unu ga-asọ asọ, nke unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha bụ ihe arụ a na-asọ oyi: ugo, udele na udele ojii, ndagbụ na ọgankwọ dị iche iche, ugolọma ọbụla dị iche iche, enyi nnụnụ, egbe abalị, nnụnụ oke osimiri na egbe dị iche iche, okwukwu nta, komorant na okwukwu ukwu, okwukwu nwere mpi, okwolo na udele
LEVITIKỌS 11:12-18 Bible Nso (IGBOB)
Ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa nime miri, ihe-árú ka ọ buru unu. Ndia ka unu gāgu kwa n'ihe-árú n'etiti anu-ufe; agaghi-eri ha, ihe-árú ka ha bu: ugo, na ego-agwọ, na ugo-azù; na ndab͕u, na agu-nkwọ di iche iche; ugolo-ọma ọ bula di iche iche; na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche; na okwukwu ntà, na cormorant, na okwukwu oku; na okwukwu nwere mpi, na okwolo, na udele