ABÙ-ÁKWÁ 3:1-20
ABÙ-ÁKWÁ 3:1-20 Bible Nso (IGBOB)
Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n'ala site na nkpa-n'aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya. Mu ka O duworo me ka m'jegharia n'ọchichiri ghara inwe ìhè. N'ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile. O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile. O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu. N'ebe nile b͕ara ọchichiri ka O meworo ka m'biri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi. Ọ b͕achiwom ogige, m'we ghara ipu apu; O mewo ka ọla eji kem ab͕u di arọ́. Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ. O werewo nkume awara awa b͕achie uzọm nile, okporo-uzọm nile ka O meworo ka ha b͕agọ ab͕agọ. Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n'ebe-nzuzo di iche iche. Uzọm nile ka O wezugaworo, O we dọbisiem; O mewom ka m'tọb͕ọrọ n'efu. Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, O guzom dika ihe edotara ib͕a àkú. O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n'akurum abua. Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile. O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ. O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu. I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma. M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova. Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí. Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem.
ABÙ-ÁKWÁ 3:1-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Abụ m onye hụrụla ahụhụ site na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe ONYENWE ANYị. O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa nʼọchịchịrị kama nʼìhè. Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m, mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile. O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ, ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ. O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu. O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga. Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị. Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka. O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ. Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche, na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya, o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka. Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata. O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi. Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile. O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ. O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m. Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ. Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka ONYENWE ANYị nweta.” Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu. Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m.