Abụ m onye hụrụla ahụhụ site na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe ONYENWE ANYị. O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa nʼọchịchịrị kama nʼìhè. Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m, mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile. O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ, ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ. O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu. O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga. Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị. Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka. O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ. Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche, na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya, o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka. Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata. O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi. Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile. O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ. O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m. Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ. Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka ONYENWE ANYị nweta.” Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu. Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m.
Gụọ Abụ Akwa 3
Geere nke a ntị Abụ Akwa 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Akwa 3:1-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị