Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 24:14-24

JOSHUA 24:14-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“Ya mere ugbu a, tụọnụ egwu ONYENWE ANYị, feekwanụ ya ofufe nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi na nʼeziokwu. Wezuganụ chi ndị ahụ niile nna nna unu ha fere ofufe nʼofe osimiri Yufretis ahụ, na nʼIjipt. Feenụ naanị ONYENWE ANYị ofufe. Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife ONYENWE ANYị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe ONYENWE ANYị.” Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ ONYENWE ANYị fee chi ndị ọzọ! Ọ bụ ONYENWE ANYị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee. Ọ bụ ONYENWE ANYị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe ONYENWE ANYị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.” Joshua zaghachiri ndị Izrel sị, “Unu apụghị ife ONYENWE ANYị ofufe; nʼihi na ọ bụ Chineke dị nsọ, bụrụkwa Chineke ekworo. Ọ gaghị agbaghara unu nnupu isi unu na mmehie unu niile. Ọ bụrụ na unu agbakụta ONYENWE ANYị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.” Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama ONYENWE ANYị ka anyị ga-efe ofufe.” Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife ONYENWE ANYị ofufe.” Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.” Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere ONYENWE ANYị Chineke Izrel isi.” Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe ONYENWE ANYị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.”

JOSHUA 24:14-24 Bible Nso (IGBOB)

Ma ub͕u a, nātunu egwu Jehova, nēfè-kwa-nu Ya òfùfè n'izu-okè na ezi-okwu: wezuga-kwa-nu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè n'ofè Osimiri ahu, na n'Ijipt; ma fènu Jehova òfùfè. Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè. Ndi Israel we za, si, Ya buru ayi ihe-árú irapu Jehova, ifè chi ọzọ òfùfè; n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, Ya onwe-ya bu onye mere ka ayi na nna-ayi-hà si n'ala Ijipt, si n'ulo ndi-orù, rigota, Onye me-kwa-ra ihe-iriba-ama uku ahu nile n'anya-ayi, debe ayi n'uzọ ahu nile nke ayi jere ije nime ya, na n'etiti ndi nile nke ayi gabigara n'etiti ha: Jehova we chupu ndi ahu nile n'iru ayi, bú ndi-Amorait ndi bi n'ala nka: ayi onwe-ayi gēfè kwa Jehova òfùfè; n'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi. Joshua we si ndi Israel, Unu apughi ifè Jehova òfùfè; n'ihi na Chineke di nsọ ka Ọ bu; Chineke ekworo ka Ọ bu; Ọ gaghi-ab͕aghara njehie-unu na nmehie nile unu. Mb͕e unu gārapu Jehova, fè chi ala ọzọ òfùfè, Ọ gēchighari kwa mejọ unu, me ka unu gwusia, mb͕e O mesiri unu nma. Ndi Israel we si Joshua, É-è; kama Jehova ka ayi gēfè òfùfè. Joshua we si ndi Israel, Ndi-àmà megide onwe-unu ka unu bu, na unu onwe-unu arọputaworo onwe-unu Jehova, ifè Ya òfùfè. Ha we si, Ndi-àmà ka ayi bu. Ọ si, Ma ub͕u a, wezuganu chi ala ọzọ nile nke di n'etiti unu, do-kwa-ra Jehova, bú Chineke Israel, obi-unu. Ndi Israel we si Joshua, Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēfè òfùfè, olu-Ya ka ayi gēge kwa nti.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara