Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Joshua 24:14-24

Joshua 24:14-24 BIU

“Ya mere ugbu a, tụọnụ egwu ONYENWE ANYị, feekwanụ ya ofufe nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi na nʼeziokwu. Wezuganụ chi ndị ahụ niile nna nna unu ha fere ofufe nʼofe osimiri Yufretis ahụ, na nʼIjipt. Feenụ naanị ONYENWE ANYị ofufe. Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife ONYENWE ANYị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe ONYENWE ANYị.” Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ ONYENWE ANYị fee chi ndị ọzọ! Ọ bụ ONYENWE ANYị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee. Ọ bụ ONYENWE ANYị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe ONYENWE ANYị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.” Joshua zaghachiri ndị Izrel sị, “Unu apụghị ife ONYENWE ANYị ofufe; nʼihi na ọ bụ Chineke dị nsọ, bụrụkwa Chineke ekworo. Ọ gaghị agbaghara unu nnupu isi unu na mmehie unu niile. Ọ bụrụ na unu agbakụta ONYENWE ANYị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.” Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama ONYENWE ANYị ka anyị ga-efe ofufe.” Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife ONYENWE ANYị ofufe.” Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.” Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere ONYENWE ANYị Chineke Izrel isi.” Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe ONYENWE ANYị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.”

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara