Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 22:1-9

JOSHUA 22:1-9 Bible Nso (IGBOB)

Mb͕e ahu Joshua kpọrọ ndi Reuben, kpọ kwa ndi Gad, kpọ kwa nkera ebo Manase, si ha, Unu onwe-unu edebewo ihe nile nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, unu egewo kwa nti olum n'ihe nile m'nyere unu n'iwu: unu arapughi umu-nne-unu ọtutu ubọchi ndia rue ta, ma unu edebewo ihe-ndebe nke ihe Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu. Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka umu-nne-unu zuru ike, dika Ọ gwara ha okwu: ub͕u a kwa chigharianu, jerue ulo-ikwū-unu n'onwe-unu, rue ala ihe-onwunwe-unu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'ofè Jọdan. Nání, lezienu anya nke-ọma ime ihe enyere n'iwu na iwu ahu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na ije íjè n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na irapara n'aru Ya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè. Joshua we gọzie ha, zilaga ha: ha we jerue ulo-ikwū-ha. Ma nkera ebo Manase ka Moses nyere ihe-nketa nime Beshan: ma Joshua nyere nkera-ya ọzọ ihe-nketa n'etiti umu-nne-ha n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu. Ọzọ kwa, mb͕e Joshua zilagara ha n'ulo-ikwū-ha, ọ gọzie ha, gwa ha okwu, si, Werenu ọtutu àkù laghachi n'ulo-ikwū-unu, were kwa anu-ulo bara uba nke-uku, were kwa ọla-ọcha, were kwa ọla-edo, were kwa ọla, were ígwè, were kwa uwe bara uba nke-uku: soronu umu-nne-unu kere ihe-nkwata ndi-iro-unu. Umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we laghachi, si n'ebe umu Israel nọ site na Shailo, nke di n'ala Kenean, ga, ijeru ala Gilead, iru ala ihe-onwunwe-ha, nke ha nwere ihe-onwunwe nime ya, dika okwu-ọnu Jehova n'aka Moses si di.

JOSHUA 22:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Emesịa, Joshua kpọkọtara ndị agha si nʼebo Ruben, na Gad, na ọkara Manase, gwa ha okwu sị: “Unu emeela ihe niile Mosis onyeozi ONYENWE ANYị nyere unu nʼiwu. Unu egeela ntị nʼolu m, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu. E, unu arụzuola ọrụ ahụ ONYENWE ANYị Chineke unu nyere unu. Unu ahapụghị ụmụnna unu nʼọgbọ agha ogologo ụbọchị ndị a niile. Ugbu a, ONYENWE ANYị Chineke unu enyela ụmụnna unu mmeri. O meekwala ka ha zuru ike dịka o kwere nkwa na ọ ga-eme. Ugbu a, laghachinụ nʼụlọ unu, laghachikwanụ nʼala unu, ala ahụ Mosis onyeozi ONYENWE ANYị nyere unu nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Ma lezienụ anya nke ọma idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Mosis onyeozi ONYENWE ANYị nyere unu: nke bụ ịhụ ONYENWE ANYị Chineke unu nʼanya, ịga ije nʼirube isi nye ya, irube isi nʼiwu ya niile, ịdabere na ya, na iji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile fee ya ofufe.” Ya mere, Joshua gọziri ha, zipụ ha, ha lakwara nʼụlọ nke aka ha. Ọkara ebo Manase ka Mosis nyere ihe nketa nke ha nʼime ala Bashan, ma ọkara ebo Manase nke ọzọ nwetara ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Mgbe Joshua na-ezilaga ha nʼụlọ ha, ọ gọziri ha, gwa ha okwu sị, “Werenụ ọtụtụ akụ unu lụtara nʼagha laa. Mgbe unu ruru, kenyenụ ndị ikwu unu ụfọdụ ihe site nʼime akụ ndị iro unu a.” Nʼihi na ihe ha kwatara nʼagha dị ukwuu: igwe anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo, na bronz, na igwe, na uwe dị iche iche. Ya mere, ndị agha Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase, hapụrụ ndị agha Izrel na Shaịlo, nʼime ala Kenan, nʼofe osimiri Jọdan, laghachi nʼala nke ha dị na Gilead, nke ha nwetara dịka iwu ONYENWE ANYị nyere Mosis si dị.