Emesịa, Joshua kpọkọtara ndị agha si nʼebo Ruben, na Gad, na ọkara Manase, gwa ha okwu sị: “Unu emeela ihe niile Mosis onyeozi ONYENWE ANYị nyere unu nʼiwu. Unu egeela ntị nʼolu m, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu. E, unu arụzuola ọrụ ahụ ONYENWE ANYị Chineke unu nyere unu. Unu ahapụghị ụmụnna unu nʼọgbọ agha ogologo ụbọchị ndị a niile. Ugbu a, ONYENWE ANYị Chineke unu enyela ụmụnna unu mmeri. O meekwala ka ha zuru ike dịka o kwere nkwa na ọ ga-eme. Ugbu a, laghachinụ nʼụlọ unu, laghachikwanụ nʼala unu, ala ahụ Mosis onyeozi ONYENWE ANYị nyere unu nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Ma lezienụ anya nke ọma idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Mosis onyeozi ONYENWE ANYị nyere unu: nke bụ ịhụ ONYENWE ANYị Chineke unu nʼanya, ịga ije nʼirube isi nye ya, irube isi nʼiwu ya niile, ịdabere na ya, na iji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile fee ya ofufe.”
Ya mere, Joshua gọziri ha, zipụ ha, ha lakwara nʼụlọ nke aka ha. Ọkara ebo Manase ka Mosis nyere ihe nketa nke ha nʼime ala Bashan, ma ọkara ebo Manase nke ọzọ nwetara ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Mgbe Joshua na-ezilaga ha nʼụlọ ha, ọ gọziri ha, gwa ha okwu sị, “Werenụ ọtụtụ akụ unu lụtara nʼagha laa. Mgbe unu ruru, kenyenụ ndị ikwu unu ụfọdụ ihe site nʼime akụ ndị iro unu a.” Nʼihi na ihe ha kwatara nʼagha dị ukwuu: igwe anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo, na bronz, na igwe, na uwe dị iche iche.
Ya mere, ndị agha Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase, hapụrụ ndị agha Izrel na Shaịlo, nʼime ala Kenan, nʼofe osimiri Jọdan, laghachi nʼala nke ha dị na Gilead, nke ha nwetara dịka iwu ONYENWE ANYị nyere Mosis si dị.