NDI-IKPE 14:1-4
NDI-IKPE 14:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Samson we ridarue Timna, hu otù nwayi nime Timna sitere n'umu-ndinyom ndi Filistia. O we rigota, gosi nna-ya, gosi kwa nne-ya, si, Ahuwom otù nwayi nime Timna sitere n'umu-ndinyom ndi Filistia: ma ub͕u a, lutaram ya na nwunye. Nna-ya na nne-ya we si ya, Ọ̀ dighi nwayi di n'etiti umu-ndinyom umu-nne-gi, ma-ọbu n'etiti ndim nile, na gi onwe-gi nēje iluru nwunye sitere na ndi Filistia, bú ndi anēbìghi úgwù? Samson we si nna-ya, Lutaram ya; n'ihi na ya onwe-ya ziri ezi n'anyam. Ma nna-ya na nne-ya amaghi na ọ bu Jehova ka o sitere n'aka; n'ihi na uzọ Ọ gēsi megide ndi Filistia ka ya onwe-ya nāchọ. Ma na mb͕e ahu ndi Filistia nāchi Israel.
NDI-IKPE 14:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Samsin gbadara nʼobodo Timna ebe ọ hụrụ otu nwaagbọghọ onye Filistia. Mgbe ọ lọtara nʼụlọ, ọ gwara nne na nna ya, “Ahụrụ m otu nwanyị nʼime Timna sitere nʼụmụ ndị inyom Filistia; ugbu a, lụtara m ya na nwunye.” Nne na nna ya zara ya, “Ọ bụ na ọ dịghị nwanyị dị nʼetiti ndị inyom ụmụnne gị, maọbụ nʼetiti ndị anyị niile? Gịnị mere o ji bụrụ nʼetiti ndị Filistia a na-ebighị ugwu ka i si lụtara onwe gị nwunye?” Ma Samsin sịrị nna ya, “Gaa lụtara m ya. Nʼihi na o ziri ezi nʼanya m.” (Nne na nna ya aghọtaghị na aka ONYENWE ANYị dị nʼọlụlụ nwunye a Samsin chọrọ ịlụ. Nʼihi na ONYENWE ANYị na-achọ ụzọ ọ ga-esi megide ndị Filistia, ndị na-achị ụmụ Izrel nʼoge ahụ.)