Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 14

14
1Samson we ridarue Timna, hu otù nwayi nime Timna sitere n'umu-ndinyom ndi Filistia. 2O we rigota, gosi nna-ya, gosi kwa nne-ya, si, Ahuwom otù nwayi nime Timna sitere n'umu-ndinyom ndi Filistia: ma ub͕u a, lutaram ya na nwunye. 3Nna-ya na nne-ya we si ya, Ọ̀ dighi nwayi di n'etiti umu-ndinyom umu-nne-gi, ma-ọbu n'etiti ndim nile, na gi onwe-gi nēje iluru nwunye sitere na ndi Filistia, bú ndi anēbìghi úgwù? Samson we si nna-ya, Lutaram ya; n'ihi na ya onwe-ya ziri ezi n'anyam. 4Ma nna-ya na nne-ya amaghi na ọ bu Jehova ka o sitere n'aka; n'ihi na uzọ Ọ gēsi megide ndi Filistia ka ya onwe-ya nāchọ. Ma na mb͕e ahu ndi Filistia nāchi Israel.
5Samson we rida, ya na nna-ya na nne-ya, rue Timna, ha we biarue ubi-vine Timna: ma, le, nwa-ọdum tozuru etozu nāb͕ọ uja izute ya. 6Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we dọwa ya dika ọ gādọwa nwa-ewu, ma ọ dighi ihe o ji n'aka-ya: ma o gosighi nna-ya, o gosighi kwa nne-ya, ihe o mere. 7Ọ we rida, gwa nwanyi ahu okwu; o ziri ezi n'anya Samson. 8Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, o we jeghachi ikuru ya, o we wezuga onwe-ya ihu ozu ọdum ahu: ma, le, ìgwè aṅu di n'ozu ọdum ahu, na manu-aṅu. 9O we rara manu-aṅu ahu n'ọbu-aka-ya abua, we nēje, nāracha ya ka ọ nēje, o we jekuru nna-ya, jekuru kwa nne-ya, nye ha, ha we racha: ma o gosighi ha na ọ bu n'ozu ọdum ka o siri rara manu-aṅu ahu. 10Nna-ya we ridakuru nwayi ahu: Samson we me oké oriri n'ebe ahu; n'ihi na otú a ka umu-okorọbia nēme. 11O rue, mb͕e ha huru ya, na ha chitara orú eyì na iri ka ha nọyere ya. 12Samson we si ha, Biko, ka m'luere unu ilu: ọ buru na unu egosim ya nke-ọma n'ubọchi asa nke oké oriri a, ọ buru na unu achọta ya, m'gēnye kwa unu orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri: 13ma ọ buru na unu apughi igosim ya, unu onwe-unu gēnyekwan orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri. Ha we si ya, Lue ilu-gi, ka ayi we nu ya. 14O we si ha,
N'aru onye nēri eri ka ihe-oriri si puta,
N'aru ihe di ike ka ihe-utọ si puta kwa.
Ma ha apughi igosi ilu ahu n'ubọchi atọ. 15O rue, n'ubọchi nke-asa, na ha siri nwunye Samson, Rà di-gi ọnu, ka o we gosi ayi ilu ahu, ka ayi we ghara isure gi na ulo nna-gi n'ọku: ọ̀ bu inapu ayi ihe nile ayi nwere ka unu kpọrọ ayi? ọ̀ bughi otú a? 16Nwunye Samson we kwakwasi ya ákwá, si, Nání asì ka i nākpọm, i hughkwam n'anya: i luworo umu ndim ilu, ma mu ka i nēgosighi ya. Ọ si ya, Le, nnam na nnem ka m'nēgosighi ya, ọ̀ bu kwa gi ka m'gēgosi ya? 17O we nākwasi ya ákwá n'ubọchi asa ahu, nke oké oriri-ha diruru: o rue, n'ubọchi nke-asa, na o gosiri ya, n'ihi na ọ kpagidesiri ya ike: o we gosi umu ndi-ya ilu ahu. 18Ndikom obdo ahu we si ya n'ubọchi nke-asa tutu anyanwu ada, Gini di utọ kari manu-aṅu? ma-ọbu gini di ike kari ọdum? O we si ha,
Ọ buru na unu ejighi nwa-ab͕ọghọ-ehim dọ ihe eji gwu ala-ubi,
Unu agaghi-achọtawori ilum.
19Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we ridarue Ashkelon, tib͕ue orú ndikom na iri n'etiti ha, chiri ihe-ha ọ lutara, nye ndi gosiworo ilu ahu uwe nb͕anwe. Iwe-ya we di ọku, o we rigorue ulo nna-ya. 20Nwunye Samson we ghọrọ nwoke-ibe Samson nwunye, bú nwoke nke Samson buru ya eyì.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NDI-IKPE 14: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye