NDI-IKPE 13:15-25
NDI-IKPE 13:15-25 Bible Nso (IGBOB)
Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Biko, kwe ka ayi b͕ochie gi, ka ayi we dozie nwa-ewu n'iru gi. Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, Ọ buru na i b͕ochiem, m'gaghi-eri nime nri-gi: ọ buru kwa na i me àjà-nsure-ọku, ọ bu Jehova ka i gēsurere ya. N'ihi na Manoa amaghi na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu. Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Gini bu aha-gi, ka ayi we sọpuru gi mb͕e okwu-gi nile gēre? Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N'ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham, ebe aha ahu di ebube? Manoa we were nwa-ewu ahu na onyinye-inata-iru-ọma, surere ya Jehova ọku n'elu oké nkume: mọ-ozi nālu kwa oké ọlu, ma Manoa na nwunye-ya nēle ya anya. O rue, mb͕e ire-ọku nēsi n'ebe-ichu-àjà ahu rigo n'elu-igwe, na mọ-ozi nke Jehova rigoro nime ire-ọku nke ebe-ichu-àjà ahu: Manoa na nwunye-ya nēle kwa ya anya; ha we da kpue iru-ha n'ala. Ma mọ-ozi ahu emeghi ka Manoa na nwunye-ya hu kwa ya anya ọzọ. Mb͕e ahu Manoa mara na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu. Manoa we si nwunye-ya, Ayi aghaghi inwu, n'ihi na ọ bu Chineke ka ayi huworo. Nwunye-ya we si ya, Ọ buru na ọ tọrọ Jehova uto ime ka ayi nwua, Ọ gaghi-anarawori àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n'aka-ayi, Ọ gaghi-eme kwa ka ayi hu ihe ndia nile, Ọ gaghi-eme kwa ayi nu ihe di otú a dika na mb͕e a. Nwanyi ahu we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Samson: nwata ahu we tó etó, Jehova we gọzie ya. Mọ nke Jehova we malite ikwali obi-ya na Mahane-dan, n'etiti Zọra na Eshtaol.
NDI-IKPE 13:15-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Manoa rịọrọ Mmụọ ozi ONYENWE ANYị si ya, “Ọ ga-amasị anyị ma ị nọdụ chere ka anyị kwadoro gị nwa ewu.” Ma Mmụọ ozi ONYENWE ANYị zara ya, “A sịkwarị na i mee ka m nọrọ, agaghị m eri nri gị ọbụla. Ma ọ bụrụ na i kwadoo aja nsure ọkụ, were ya chụọrọ ONYENWE ANYị aja.” Ma Manoa aghọtaghị na onye ahụ bụ Mmụọ ozi ONYENWE ANYị. Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi ONYENWE ANYị ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?” Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m? Ọ bụ ihe karịrị nghọta.” Mgbe ahụ, Manoa weere nwa ewu, ya na ụfọdụ mkpụrụ ọka, jiri ha chụọrọ ONYENWE ANYị aja nʼelu nkume. Mgbe ahụ kwa, ONYENWE ANYị mere ihe dị ebube nke ukwuu mgbe Manoa na nwunye ya guzo na-ele anya: Mgbe ire ọkụ ahụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ na-arịgo na-aga elu, Mmụọ ozi ONYENWE ANYị wụliri elu soro ire ọkụ ahụ rigoro gawa nʼeluigwe! Mgbe Manoa na nwunye ya hụrụ ka nke a na-eme, ha kpuru ihu ha nʼala. Mgbe Mmụọ ozi ONYENWE ANYị na-egosighị onwe ya ọzọ nye Manoa na nwunye ya, ka Manoa ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi ONYENWE ANYị ka ha hụrụ. Manoa gwara nwunye ya sị, “Anyị abụrụla ndị nwụrụ anwụ, nʼihi na anyị ahụla Chineke!” Ma nwunye ya zara sị ya, “Ọ bụrụ na ONYENWE ANYị chọrọ igbu anyị, ọ garaghị anara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka anyị chụrụ nye ya. Ọzọkwa, ọ garaghị egosi anyị ihe ndị a niile maọbụ gwa anyị ihe ndị a.” Emesịa, nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke, onye ha gụrụ Samsin. ONYENWE ANYị gọzikwara nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-etolite. Mmụọ ONYENWE ANYị bidokwara na-agba ya ume nʼoge niile, mgbe ọ nọ Mahane Dan, nke dị nʼetiti Zora na Eshtaol.