Manoa rịọrọ Mmụọ ozi ONYENWE ANYị si ya, “Ọ ga-amasị anyị ma ị nọdụ chere ka anyị kwadoro gị nwa ewu.”
Ma Mmụọ ozi ONYENWE ANYị zara ya, “A sịkwarị na i mee ka m nọrọ, agaghị m eri nri gị ọbụla. Ma ọ bụrụ na i kwadoo aja nsure ọkụ, were ya chụọrọ ONYENWE ANYị aja.” Ma Manoa aghọtaghị na onye ahụ bụ Mmụọ ozi ONYENWE ANYị.
Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi ONYENWE ANYị ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?”
Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m? Ọ bụ ihe karịrị nghọta.” Mgbe ahụ, Manoa weere nwa ewu, ya na ụfọdụ mkpụrụ ọka, jiri ha chụọrọ ONYENWE ANYị aja nʼelu nkume. Mgbe ahụ kwa, ONYENWE ANYị mere ihe dị ebube nke ukwuu mgbe Manoa na nwunye ya guzo na-ele anya: Mgbe ire ọkụ ahụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ na-arịgo na-aga elu, Mmụọ ozi ONYENWE ANYị wụliri elu soro ire ọkụ ahụ rigoro gawa nʼeluigwe! Mgbe Manoa na nwunye ya hụrụ ka nke a na-eme, ha kpuru ihu ha nʼala. Mgbe Mmụọ ozi ONYENWE ANYị na-egosighị onwe ya ọzọ nye Manoa na nwunye ya, ka Manoa ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi ONYENWE ANYị ka ha hụrụ.
Manoa gwara nwunye ya sị, “Anyị abụrụla ndị nwụrụ anwụ, nʼihi na anyị ahụla Chineke!”
Ma nwunye ya zara sị ya, “Ọ bụrụ na ONYENWE ANYị chọrọ igbu anyị, ọ garaghị anara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka anyị chụrụ nye ya. Ọzọkwa, ọ garaghị egosi anyị ihe ndị a niile maọbụ gwa anyị ihe ndị a.”
Emesịa, nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke, onye ha gụrụ Samsin. ONYENWE ANYị gọzikwara nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-etolite. Mmụọ ONYENWE ANYị bidokwara na-agba ya ume nʼoge niile, mgbe ọ nọ Mahane Dan, nke dị nʼetiti Zora na Eshtaol.