AISAIA 7:10-15
AISAIA 7:10-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ dịghị anya, ONYENWE ANYị ziri Ehaz ozi ndị a sị, “Jụọ m bụ ONYENWE ANYị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa ONYENWE ANYị m otu a.” Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya? Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị. Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwantakịrị ahụ ga-eri mgbe ọ matara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ezi ihe.
AISAIA 7:10-15 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we gwa kwa Ehaz okwu ọzọ, si, Riọrọ onwe-gi ihe-iriba-ama n'aka Jehova, bú Chineke-gi; riọ ya n'ebe miri emi, ma-ọbu n'ebe di elu nke di n'elu. Ehaz we si, M'gaghi-ariọ, m'gaghi-anwa kwa Jehova. O we si, Biko, nurunu, ulo Devid; ọ̀ bu ihe ntà na unu nēme ka ike gwu madu, na unu gēme kwa ka ike gwu Chinekem? N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel. Miri-ara-ehi raruru araru na manu-aṅu ka nwa-okoro ahu gēri, mb͕e ọ mara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe.