Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 7

7
1O rue, n'ubọchi Ehaz nwa Jotam, nwa Uzaia, bú eze Juda, na Rezin, bú eze Siria, rigoro, ya na Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, rue Jerusalem, ibu agha megide ya; ma ọ pughi ibu agha megide ya. 2Ewe gosi ulo Devid, si, Siria nēzu ike n'elu Efraim. Obi-ya na obi ndi-ya we me nkpatu, dika osisi nile nke oké ọhia si eme nkpatu n'iru ifufe.
3Jehova we si Aisaia, Biko, pua izute Ehaz, gi onwe-gi, na Shea-jashub nwa-gi, rue nsọtu uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, rue uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà; 4si ya, Lezie anya, nọ kwa jū; atula egwu, ka obi-gi ghara kwa itu ujọ, site n'ọdudù abua ndia nke ọlọkọ-ọku nākwu anwuru-ọku, n'ihi iwe di ọku nke Rezin na Siria, na nke nwa Remalaia. 5N'ihi na Siria aduwo ọdu imegide gi ihe ọjọ, Efraim kwa, na nwa Remalaia, si, 6Ka ayi rigo imegide Juda, ka ayi me kwa ka ike gwusia ya, ka ayi wapuere onwe-ayi ya, me ka otù onye buru eze n'etiti ya, bú nwa Tabeel. 7Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ gaghi-eguzosi ike, ọ gaghi-adi kwa. 8N'ihi na isi Siria bu Damaskọs, isi Damaskọs bu kwa Rezin: ma tutu ọgu arọ atọ na ise eruzue agētipia Efraim, ka ọ ghara ibu otù ndi: 9ọzọ, isi Efraim bu Sameria, isi Sameria bu kwa nwa Remalaia. Ọ buru na unu adighi-ekwe, n'ezie unu agaghi-ekwesi ntukwasi-obi.
10Jehova we gwa kwa Ehaz okwu ọzọ, si, 11Riọrọ onwe-gi ihe-iriba-ama n'aka Jehova, bú Chineke-gi; riọ ya n'ebe miri emi, ma-ọbu n'ebe di elu nke di n'elu. 12Ehaz we si, M'gaghi-ariọ, m'gaghi-anwa kwa Jehova. 13O we si, Biko, nurunu, ulo Devid; ọ̀ bu ihe ntà na unu nēme ka ike gwu madu, na unu gēme kwa ka ike gwu Chinekem? 14N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel. 15Miri-ara-ehi raruru araru na manu-aṅu ka nwa-okoro ahu gēri, mb͕e ọ mara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe. 16N'ihi na tutu nwa-okoro ahu amara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe, agārapu ala ahu nke ike eze-ha abua gwuworo gi onwe-gi. 17Jehova gēme ka ubọchi biakwasi n'aru gi na n'aru ndi-gi, na n'aru ulo nna-gi, bú ubọchi nke nābiaghi site n'ubọchi Efraim wezugara onwe-ya n'aru Juda; ọbuná eze Asiria.
18O gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gākpọkọta ijiji nke di na nsọtu osimiri Nail nile nke Ijipt òkù, kpọ kwa aṅu nke di n'ala Asiria. 19Ha gābia kwa, ha nile gēbekwasi kwa na ndagwurugwu nile nke ebe di nkputankpu, na nime nb͕awa nile nke nkume nile di elu, na n'ogwu nile, na n'ọzara nile.
20N'ubọchi ahu Onye-nwe-ayi gēji aguba nke egotara egota n'ofè nile nke Osimiri, bú eze Asiria, kọpu isi na aji ukwu: ọbuná afu-ọnu ka ọ gākọchapu kwa.
21O geru kwa, n'ubọchi ahu, na otù onye gēdebe otù nwa-ab͕ọghọ-ehi nke ìgwè ehi-ya, na nne-aturu abua nke ìgwè ewu na aturu-ya ndu; 22ọ gēru kwa, site n'ọtutu miri-ara ha gāb͕a, na ọ gēri miri-ara raruru araru: n'ihi na miri-ara raruru araru na manu-aṅu ka onye ọ bula nke fọduru n'etiti ala nka gēri.
23O gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ebe ọ bula, nke nnù vine abua na ọgu iri di ya, nke ọnu-ahia-ha bu nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri, ọ gādiri ogwu, di-kwa-ra uke. 24Agāchiri àkú, were kwa uta, bia n'ebe ahu; n'ihi na nání ogwu na uke ka ala nka nile gābu. 25Ma ugwu nile nke anējiri ọ́gù bọ, i gaghi-abà n'ebe ahu n'ihi egwu ogwu na uke, kama ọ gābu ebe anēziga ehi, na ebe aturu nāzọ ukwu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

AISAIA 7: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara