AISAIA 7:1-25
AISAIA 7:1-25 Bible Nso (IGBOB)
O rue, n'ubọchi Ehaz nwa Jotam, nwa Uzaia, bú eze Juda, na Rezin, bú eze Siria, rigoro, ya na Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, rue Jerusalem, ibu agha megide ya; ma ọ pughi ibu agha megide ya. Ewe gosi ulo Devid, si, Siria nēzu ike n'elu Efraim. Obi-ya na obi ndi-ya we me nkpatu, dika osisi nile nke oké ọhia si eme nkpatu n'iru ifufe. Jehova we si Aisaia, Biko, pua izute Ehaz, gi onwe-gi, na Shea-jashub nwa-gi, rue nsọtu uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, rue uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà; si ya, Lezie anya, nọ kwa jū; atula egwu, ka obi-gi ghara kwa itu ujọ, site n'ọdudù abua ndia nke ọlọkọ-ọku nākwu anwuru-ọku, n'ihi iwe di ọku nke Rezin na Siria, na nke nwa Remalaia. N'ihi na Siria aduwo ọdu imegide gi ihe ọjọ, Efraim kwa, na nwa Remalaia, si, Ka ayi rigo imegide Juda, ka ayi me kwa ka ike gwusia ya, ka ayi wapuere onwe-ayi ya, me ka otù onye buru eze n'etiti ya, bú nwa Tabeel. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ gaghi-eguzosi ike, ọ gaghi-adi kwa. N'ihi na isi Siria bu Damaskọs, isi Damaskọs bu kwa Rezin: ma tutu ọgu arọ atọ na ise eruzue agētipia Efraim, ka ọ ghara ibu otù ndi: ọzọ, isi Efraim bu Sameria, isi Sameria bu kwa nwa Remalaia. Ọ buru na unu adighi-ekwe, n'ezie unu agaghi-ekwesi ntukwasi-obi. Jehova we gwa kwa Ehaz okwu ọzọ, si, Riọrọ onwe-gi ihe-iriba-ama n'aka Jehova, bú Chineke-gi; riọ ya n'ebe miri emi, ma-ọbu n'ebe di elu nke di n'elu. Ehaz we si, M'gaghi-ariọ, m'gaghi-anwa kwa Jehova. O we si, Biko, nurunu, ulo Devid; ọ̀ bu ihe ntà na unu nēme ka ike gwu madu, na unu gēme kwa ka ike gwu Chinekem? N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel. Miri-ara-ehi raruru araru na manu-aṅu ka nwa-okoro ahu gēri, mb͕e ọ mara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe. N'ihi na tutu nwa-okoro ahu amara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe, agārapu ala ahu nke ike eze-ha abua gwuworo gi onwe-gi. Jehova gēme ka ubọchi biakwasi n'aru gi na n'aru ndi-gi, na n'aru ulo nna-gi, bú ubọchi nke nābiaghi site n'ubọchi Efraim wezugara onwe-ya n'aru Juda; ọbuná eze Asiria. O gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gākpọkọta ijiji nke di na nsọtu osimiri Nail nile nke Ijipt òkù, kpọ kwa aṅu nke di n'ala Asiria. Ha gābia kwa, ha nile gēbekwasi kwa na ndagwurugwu nile nke ebe di nkputankpu, na nime nb͕awa nile nke nkume nile di elu, na n'ogwu nile, na n'ọzara nile. N'ubọchi ahu Onye-nwe-ayi gēji aguba nke egotara egota n'ofè nile nke Osimiri, bú eze Asiria, kọpu isi na aji ukwu: ọbuná afu-ọnu ka ọ gākọchapu kwa. O geru kwa, n'ubọchi ahu, na otù onye gēdebe otù nwa-ab͕ọghọ-ehi nke ìgwè ehi-ya, na nne-aturu abua nke ìgwè ewu na aturu-ya ndu; ọ gēru kwa, site n'ọtutu miri-ara ha gāb͕a, na ọ gēri miri-ara raruru araru: n'ihi na miri-ara raruru araru na manu-aṅu ka onye ọ bula nke fọduru n'etiti ala nka gēri. O gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ebe ọ bula, nke nnù vine abua na ọgu iri di ya, nke ọnu-ahia-ha bu nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri, ọ gādiri ogwu, di-kwa-ra uke. Agāchiri àkú, were kwa uta, bia n'ebe ahu; n'ihi na nání ogwu na uke ka ala nka nile gābu. Ma ugwu nile nke anējiri ọ́gù bọ, i gaghi-abà n'ebe ahu n'ihi egwu ogwu na uke, kama ọ gābu ebe anēziga ehi, na ebe aturu nāzọ ukwu.
AISAIA 7:1-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Ehaz, nwa Jotam, nwa nwa Ụzaya bụ eze na Juda, Rezin eze Aram, na Peka eze Izrel, nwa Remalaya, busoro Jerusalem agha. Ma ha emerighị ya; obodo ahụ guzosiri ike. Ma mgbe e mesịrị, ozi ruru ụlọ Devid ntị sị, “Ndị Aram na Ifrem ejikọọla onwe ha ọnụ”; nke a mere ka ụlọeze, na obi ndị ọ na-achị maa jijiji, dịka osisi dị nʼọhịa si ama jijiji mgbe oke ifufe na-efe. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Aịzaya okwu sị ya, “Jekwuru Ehaz bụ eze. Mgbe ị na-aga, kpọrọ Shịa-Jashub nwa gị nwoke. Unu ga-ahụ Ehaz nʼakụkụ Elu elu olulu ọdọ mmiri nke dị nʼụzọ ahụ gawara nʼAla ọsụ akwa. Gwa ya ka ọ ghara inye ndụ ya nsogbu, ka ọ gharakwa ịtụ egwu. Sị ya, ‘Lezie anya, nọ jụụ, echegbula onwe ya banyere icheku ọkụ abụọ ahụ na-anyụ anyụ. Atụla egwu nʼihi iwe Rezin nwa Aram, na iwe Peka nwa Remalaya. E, Aram, na Ifrem, na nwa nwoke Remalaya, agbaala izu ibuso gị agha ịla gị nʼiyi. Ha ekwuola sị, “Ka anyị wakpo Juda, ka anyị dọwaa ya ma kee ya nʼetiti onwe anyị, mee nwa Tabeel ka ọ bụrụ eze ya.” Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwuru, “ ‘Ọ gaghị adị ire! Ọ gaghị emezukwa. Nʼihi isi obodo Aram bụ Damaskọs. Onyeisi Damaskọs bụ naanị Rezin. Ma tupu afọ iri isii na ise agafee a ga-etikpọkwa Ifrem. Isi obodo Ifrem bụ Sameria. Onyeisi Sameria bụ naanị nwa Remalaya. Ọ bụrụ na unu eguzosighị ike nʼokwukwe unu, unu agaghị eguzo ma ọlị.’ ” Ọ dịghị anya, ONYENWE ANYị ziri Ehaz ozi ndị a sị, “Jụọ m bụ ONYENWE ANYị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa ONYENWE ANYị m otu a.” Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya? Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị. Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwantakịrị ahụ ga-eri mgbe ọ matara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ezi ihe. Tupu a zụlite nwantakịrị ahụ ịmata ịhọrọ ezi ihe na ịjụ ajọ ihe, ndị eze abụọ ndị ị na-atụ egwu ha, ga-anwụcha. ONYENWE ANYị ga-eme ka ọbụbụ ọnụ dị ukwuu bịakwasị gị na obodo gị, na ezinaụlọ gị. Ihe egwu ga-adịkwa, ụdị nke a na-ahụbeghị mbụ, site nʼoge e kewapụrụ Ifrem site na Juda. Eze Asịrịa ga-edu ndị agha ya bịa.” ONYENWE ANYị Nʼụbọchị ahụ, ONYENWE ANYị ga-akpọku ijiji site na nsọtụ Naịl dị nʼIjipt nakwa aṅụ sitere nʼala Asịrịa. Ha ga-abịa nʼigwe, bichie ndagwurugwu ala gị niile, na nʼọgba nkume niile, na nʼọhịa ogwu ogwu niile, na nʼọzara niile, na nʼezi ala niile. Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji agụba e gotara nʼofe osimiri, nke bụ eze Asịrịa, kpụchapụ unu agịrị isi na ajị ụkwụ, kpụchapụkwa afụọnụ unu niile. Nʼụbọchị ahụ, otu onye ga-edebe otu nwa ehi na ewu abụọ ndụ. Onye ọbụla kwa nʼala ahụ ga-eri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, ya na mmanụ aṅụ, nʼihi na mmiri ara ehi ga-aba ụba nke ukwuu nʼala ahụ. Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke. Ndị dinta ga-achịrị àkụ na ùta gaa nʼebe ahụ, nʼihi na uke na ogwu ga-ekpuchi ala ahụ. Ma banyere ugwu eji ọgụ kọọ na mbụ, ị gaghị abakwa nʼebe ahụ ọzọ nʼihi egwu uke na ogwu; ha ga-abụ ebe a na-atọpụ ehi na ebe atụrụ na-agbagharị.