AISAIA 57:18-19
AISAIA 57:18-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha. Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi. Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha. Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,” ka ONYENWE ANYị kwuru. “Aga m agwọkwa ha.”
Kesaa
Gụọ AISAIA 57AISAIA 57:18-19 Bible Nso (IGBOB)
Uzọ-ya nile ka M'huworo, M'gēme kwa ka aru di ya ike: M'gēdu kwa ya, nyeghachi ya nkasi-obi nile, nyeghachi kwa ndi-ya nēru újú. Anamekè nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu abua: Udo, udo, diri onye nọ n'ebe di anya, di-kwa-ra onye nọ nso, ka Jehova siri; M'gēme kwa ka aru di ya ike.
Kesaa
Gụọ AISAIA 57