Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 57

57
1Onye ezi omume nāla n'iyì, ma ọ dighi onye ọ bula nētiye ya n'obi-ya; anēkpochapu kwa ndi-ebere, mb͕e ọ nādighi onye nāghọta na ekpochapuworo onye ezi omume n'iru ihe ọjọ. 2Ọ nābà n'udo; ha nēzu ike n'elu ihe-ndina-ya, onye ọ bula nke nāgazi agazi.
3Ma unu onwe-unu, biaruenu nso ebe a, unu umu-ndikom nke nwanyi ji igwe-oji atu isi ọma na isi ọjọ, unu nkpuru nke nwoke nākwa iko na nwanyi nākwa iko. 4Ònye ka ọ nātọ unu utọ imegide? ònye ka unu nāsaghepu ọnu mbara, riputasi kwa ire, imegide? ùnu onwe-unu abughi umu njehie, nkpuru okwu-ugha, 5unu ndi nēme onwe-unu ka unu di ọku n'etiti osisi terebinth, n'okpuru osisi ndu ọ bula; ndi nēb͕u umu-unu na ndagwurugwu nile n'okpuru nb͕awa nke nkume nile di elu? 6N'etiti nkume kwọrọ murumuru nke miri-iyi ka òkè-gi di; ha onwe-ha, ha onwe-ha bu ihe ruru gi n'ife-nzà: ọ bu kwa ha ka i wusiworo àjà-ihe-ọṅuṅu nye, sure kwa àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma. Àgākasim obi bayere ihe ndia? 7N'elu ugwu di elu, nke eme-kwa-ra ka ọ di elu, ka i doworo ihe-ndina-gi: ọ bu kwa n'ebe ahu ka i rigoro ichu àjà. 8Ọ bu kwa n'azu ọnu-uzọ-gi na akuku-ọnu-uzọ-gi ka i doworo ihe-ncheta-gi: n'ihi na mb͕e M'nānọghi ka i kpupuru ihe-ndina-gi, we rigo: i mere ka ihe-ndina-gi sa mbara, we soro ha b͕ara onwe-gi ndu; i huru ihe-ndina-ha n'anya; aka-ha ka i huru. 9I we were manu jegharikuru eze ahu, i me-kwa-ra manu-otite-gi nēsì ísì utọ ka ha ba uba, i zi-kwa-ra ndi-ukọ-gi n'ebe di anya, i we me onwe-gi ka i di ala rue ala-mọ. 10N'iba-uba nke uzọ-gi ka ike gwusiri gi; i sighi, Ntukwasi-obi adigh: ndu aka-gi ka i chọtara; n'ihi ya i riaghi ọria. 11Ma ònye ka i cheb͕uworo onwe-gi bayere ya, we tua egwu ya, na i nēkwu okwu-ugha, we ghara ichetam, ghara kwa itiye ya n'obi-gi? Mù onwem adighi-ab͕a nkiti ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, i we ghara itu egwum? 12Mu onwem gēgosi ezi omume-gi; ma ọlu-gi nile, ha agaghi-abara gi urù. 13Mb͕e i nēti nkpu, ka ndi i chikọtaworo naputa gi; ma ha nile ka ifufe gēfepu, otù nku-ume gēkupu ha: ma onye ahu nke nab͕abà nimem gēketa ala, nweta kwa ugwu nsọm. 14Ọ gāsi kwa, Tulienu, tulienu, dozienu uzọ, bupunu ihe-isu-ngọngọ n'uzọ ndim.
15N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu. 16N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gānalu ọ̀gù, ọ bughi kwa rue mb͕e nile ka M'ganēwe iwe: n'ihi na mọ gāda #mbà n'irum, ya na nkpuru-obi nile Mu onwem meworo. 17N'ihi ajọ omume nke urù-ya ka M'were iwe, we tie ya ihe, nēzobe irum nēwe kwa iwe: o we nāga nēchighari azu n'uzọ nke obi-ya. 18Uzọ-ya nile ka M'huworo, M'gēme kwa ka aru di ya ike: M'gēdu kwa ya, nyeghachi ya nkasi-obi nile, nyeghachi kwa ndi-ya nēru újú. 19Anamekè nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu abua: Udo, udo, diri onye nọ n'ebe di anya, di-kwa-ra onye nọ nso, ka Jehova siri; M'gēme kwa ka aru di ya ike. 20Ma ndi nēmebi iwu di ka oké osimiri nke nāmaghari amaghari: n'ihi na ọ pughi idi jū, miri-ya nāmaputa kwa urọ na apiti. 21Ọ dighi udo ndi nēmebi iwu nwere, ka Chinekem siri.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

AISAIA 57: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye