NDI-HIBRU 1:1-4
NDI-HIBRU 1:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche. Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe. Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha.
NDI-HIBRU 1:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Chineke, mb͕e Ọ gwarari nna-ayi-hà okwu n'oge ochie nime ndi-amuma n'iberibe-akwukwọ di iche iche na uzọ di iche iche, Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile; Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu; ebe emere Ya-ri ka Ọ ka ndi-mọ-ozi nma n'uzọ ra otú O ketawa aha nke ka nma.