Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-HIBRU 1

1
1Chineke, mb͕e Ọ gwarari nna-ayi-hà okwu n'oge ochie nime ndi-amuma n'iberibe-akwukwọ di iche iche na uzọ di iche iche, 2Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile; 3Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu; 4ebe emere Ya-ri ka Ọ ka ndi-mọ-ozi nma n'uzọ ra otú O ketawa aha nke ka nma. 5N'ihi na ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula,
Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,
Mu onwem amuwo Gi ta?
ọzọ kwa,
Mu onwem gāburu Ya Nna,
Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara?
6Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya. 7Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si,
Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe,
Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:
8ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si,
Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi;
Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka nke ala-eze-Gi bu kwa.
9I huru ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì;
N'ihi nka Chineke, bú Chineke-Gi, tere Gi
Manu obi-utọ n'isi kari ndi-nketa-ibe-Gi.
10Ọzọ kwa,
Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, na mbu ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;
Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa:
11Ha onwe-ha gāla n'iyì; ma Gi onwe-gi nānọgide:
Ha nile gāka kwa nká dika uwe;
12Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāpiakọta kwa ha,
Dika uwe, agāb͕anwe kwa ha:
Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile,
Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu.
13Ma ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka O kwuworo okwu bayere ya mb͕e ọ bula, si,
Nọdu ala n'aka-nrim,
Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi ukwu-Gi abua?
14Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NDI-HIBRU 1: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara