Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

HAGAI 2:9-23

HAGAI 2:9-23 Bible Nso (IGBOB)

Ebube ikpe-azu nke ulo a gādi uku kari ebube mbu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: ọ bu kwa n'ebe a ka M'gēnye udo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta. N'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, okwu Jehova we si n'aka Hagai bú onye-amuma, bia, si Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Biko, jua ndi-nchu-àjà ajuju iwu, si, Le, ọ buru na onye ọ bula eburu anu nsọ n'ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya, were kwa ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya metu achicha, ma-ọbu ofé, ma-ọbu manya-vine, ma-ọbu manu, ma-ọbu ihe-oriri ọ bula, ọ̀ gādi nsọ? Ndi-nchu-àjà we za, si, É-è. Hagai we si, Ọ buru na onye ruru árú site na madu nwuru anwu emetu ihe ọ bula n'ihe ndia, ọ̀ gāru árú? Ndi-nchu-àjà we za, si, Ọ gāru árú. Hagai we za, si, Otú a ka ndi nka di, ọ bu kwa otú a ka mba nka di n'irum; (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ọ bu kwa otú a ka ọlu ọ bula nke aka-ha di; ọzọ, ihe ha nēweta nso n'ebe ahu, ihe ruru árú ka ọ bu. Ma ub͕u a, biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a site n'ubọchi ta laghachi azu, site na mb͕e akātukwasighi nkume n'elu nkume n'ulo uku Jehova: na mb͕e ahu nile, mb͕e madu biara n'obo-ihe di orú ọtùtù, ha di nání iri; mb͕e madu biara n'ebe-inara-manya-vine ikupu ọgu ite abua na iri, nání orú di. Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, ji kwa ákú-miri-ígwé, tib͕ue unu n'ọlu nile nke aka-unu; ma ọ dighi nchighari unu chigharikuterem; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a, site n'ubọchi ta laghachi azu, site n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, site n'ubọchi ahu mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo uku Jehova, tukwasinu obi-unu na ya. Nkpuru-ọghigha, ọ̀ di n'ọba rue ub͕u a? ọzọ kwa, osisi vine na osisi fig na osisi pomegranate na osisi olive amighi nkpuru; site n'ubọchi ta ka M'ganāgọzi unu. Okwu Jehova we rue Hagai nti nke ub͕ò abua n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa ahu, si, Gwa Zerubabel, bú onye nāchi ala Juda, okwu, si, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa me nkpatu: M'gākwatu kwa oche-eze nke ala-eze nile, M'gēkpochapu kwa ike nke ala-eze nile nke mba nile; M'gākwatu kwa ub͕ọ-ala, na ndi nānọkwasi ha; inyinya na ndi nānọkwasi ha gārida kwa, onye ọ bula site na mma-agha nwa-nne-ya. N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka M'gēwere gi, Zerubabel nwa Shealtiel, bú orùm, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me gi ka i di ka nb͕a-aka-akàrà: n'ihi na gi ka M'rọputaworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

HAGAI 2:9-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

‘Ebube nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube nke mbụ,’ ọ bụ ihe ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọ bụkwa nʼebe a ka m ga-enye ọganihu na udo,’ otu a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.” Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa itoolu, nke afọ abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu ONYENWE ANYị bịakwutere onye amụma, bụ Hegai. “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Jụọ ndị nchụaja ihe iwu na-ekwu. Ọ bụrụ na mmadụ etinye anụ e doro nsọ nʼakpa uwe ya, ọ bụrụkwa na uwe ahụ anụ nsọ ahụ dị nʼime ya emetụ achịcha, maọbụ ofe, maọbụ nri ọzọ dị iche, mmetụ uwe ahụ metụrụ ha ọ ga-eme ka ha dịrị nsọ?’ ” Ndị nchụaja zara sị: “Mba!” Mgbe ahụ Hegai kwukwara, “Ọ bụrụ na mmadụ emerụọ onwe ya site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka, mesịa metụ otu nʼime ihe ndị a aka, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ?” Ndị nchụaja zara sị, “E, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ.” Mgbe ahụ Hegai kwuru sị, “ ‘Otu a ka mba a na ndị bi nʼime ya dị nʼihu m. Ihe ọbụla aka ha rụpụtara na onyinye ọbụla ha nyere bụ ihe rụrụ arụ.’ Ọ bụ ihe ONYENWE ANYị kwuru. “ ‘Ma ugbu a, chezienụ echiche banyere ihe ndị ga-emenụ site taa gaa nʼihu. Tuleenụ otu ihe si dị tupu adọnye otu nkume nʼelu ibe ya nʼụlọnsọ ukwu nke ONYENWE ANYị. Kedụ ọnọdụ unu? Mgbe mmadụ bịara nʼebe o debere ọtụtụ iri efere ọka abụọ, ihe ọ na-ahụ bụ naanị ọtụtụ efere ọka iri. Ọ bụrụkwa na ọ bịa nʼebe ịnara mmanya ka o were iri ite mmanya ise, ọ bụ naanị iri ite mmanya abụọ ka ọ ga-enweta. Eji m ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu, na mkpụrụ mmiri igwe bibie ọrụ aka unu niile; ma unu alọghachikwuteghị m,’ ọ bụ ihe ONYENWE ANYị kwupụtara. ‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, site nʼụbọchị taa bụ iri ụbọchị anọ nke ọnwa itoolu, chenụ echiche banyere ụbọchị a bụ ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị. Chezienụ echiche banyere ya. Ọ ka nwere mkpụrụ ọghịgha unu nwere nʼọba unu? Ọzọkwa, osisi vaịnị, osisi fiig, osisi pomegranet na osisi oliv amịghị mkpụrụ, ruo ugbu a. “ ‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu aga m agọzi unu.’ ” ONYENWE ANYị Okwu ONYENWE ANYị bịakwutere Hegai nke ugboro abụọ, nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa ahụ, sị, “Gwa Zerubabel, onye na-achị Juda sị ana m aga ịyọgharị eluigwe na ụwa. Aga m akwatu ocheeze alaeze dị iche iche, ana m agakwa imebi ike alaeze nke mba dị iche iche. Aga m akwatu ụgbọ ịnyịnya nʼala na ndị na-anya ha; ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-adakwa. Onye ọbụla ga-adakwa site na mma agha nke onye otu ya. “ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, ‘Aga m ewere gị bụ onyeozi m Zerubabel nwa Shealtiel,’ ọ bụ ihe ONYENWE ANYị kwuru, ‘mee gị ka ị dị ka mgbaaka akara m, nʼihi na ahọrọla m gị,’ Ọ bụ ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.”