HAGAI 2
2
1N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu, okwu Jehova we si n'aka Hagai, bú onye-amuma, bia, si, 2Biko, gwa Zerubabel nwa Shealtiel okwu, bú onye nāchi ala Juda, gwa kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, gwa kwa ndi Israel fọduru, si, 3Ònye fọduru n'etiti unu nke huru ulo a n'ebube mbu ya? ọ̀ di kwa aṅa n'anya-unu onwe-unu ub͕u a? ọ̀ dighi nání ka ihe-efu n'anya-unu? 4Ma ub͕u a, di ike, Zerubabel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); di ike, Joshua, nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà; di ike, unu ndi nile nke ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), luanu ọlu: n'ihi na Mu onwem nọyere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), 5dika okwu ahu si di nke Mu na unu b͕ara n'ọb͕ub͕a-ndu-mb͕e unu siri n'Ijipt puta, Mọm nēguzo kwa n'etiti unu: unu atula egwu. 6N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ fọduru otù ub͕ò, nwa mb͕e ntà ka ọ bu, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa na oké osimiri na ala kpọrọ nku me nkpatu; 7M'gēme kwa ka mba nile me nkpatu, ihe anāchọsi ike nke mba nile gābia kwa, M'gēmeju kwa ulo a n'ebube, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 8Mu nwe ọla-ọcha nile, ọ bu kwa Mu nwe ọla-edo nile; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 9Ebube ikpe-azu nke ulo a gādi uku kari ebube mbu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: ọ bu kwa n'ebe a ka M'gēnye udo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.
10N'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, okwu Jehova we si n'aka Hagai bú onye-amuma, bia, si 11Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Biko, jua ndi-nchu-àjà ajuju iwu, si, 12Le, ọ buru na onye ọ bula eburu anu nsọ n'ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya, were kwa ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya metu achicha, ma-ọbu ofé, ma-ọbu manya-vine, ma-ọbu manu, ma-ọbu ihe-oriri ọ bula, ọ̀ gādi nsọ? Ndi-nchu-àjà we za, si, É-è. 13Hagai we si, Ọ buru na onye ruru árú site na madu nwuru anwu emetu ihe ọ bula n'ihe ndia, ọ̀ gāru árú? Ndi-nchu-àjà we za, si, Ọ gāru árú. 14Hagai we za, si, Otú a ka ndi nka di, ọ bu kwa otú a ka mba nka di n'irum; (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ọ bu kwa otú a ka ọlu ọ bula nke aka-ha di; ọzọ, ihe ha nēweta nso n'ebe ahu, ihe ruru árú ka ọ bu. 15Ma ub͕u a, biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a site n'ubọchi ta laghachi azu, site na mb͕e akātukwasighi nkume n'elu nkume n'ulo uku Jehova: 16na mb͕e ahu nile, mb͕e madu biara n'obo-ihe di orú ọtùtù, ha di nání iri; mb͕e madu biara n'ebe-inara-manya-vine ikupu ọgu ite abua na iri, nání orú di. 17Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, ji kwa ákú-miri-ígwé, tib͕ue unu n'ọlu nile nke aka-unu; ma ọ dighi nchighari unu chigharikuterem; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 18Biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a, site n'ubọchi ta laghachi azu, site n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, site n'ubọchi ahu mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo uku Jehova, tukwasinu obi-unu na ya. 19Nkpuru-ọghigha, ọ̀ di n'ọba rue ub͕u a? ọzọ kwa, osisi vine na osisi fig na osisi pomegranate na osisi olive amighi nkpuru; site n'ubọchi ta ka M'ganāgọzi unu.
20Okwu Jehova we rue Hagai nti nke ub͕ò abua n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa ahu, si, 21Gwa Zerubabel, bú onye nāchi ala Juda, okwu, si, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa me nkpatu: 22M'gākwatu kwa oche-eze nke ala-eze nile, M'gēkpochapu kwa ike nke ala-eze nile nke mba nile; M'gākwatu kwa ub͕ọ-ala, na ndi nānọkwasi ha; inyinya na ndi nānọkwasi ha gārida kwa, onye ọ bula site na mma-agha nwa-nne-ya. 23N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka M'gēwere gi, Zerubabel nwa Shealtiel, bú orùm, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me gi ka i di ka nb͕a-aka-akàrà: n'ihi na gi ka M'rọputaworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
HAGAI 2: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.