JENESIS 7:1-10
JENESIS 7:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ụbọchị ahụ zuru, ONYENWE ANYị kpọrọ Noa sị ya, “Baa nʼime ụgbọ mmiri, gị na ezinaụlọ gị niile, nʼihi na nʼime ndị niile bi nʼọgbọ a, ọ bụ naanị gị bụ onye ezi omume m hụrụ. Kpọrọ ụmụ anụmanụ ndị a a gụrụ dịka ndị dị ọcha, dịka ụdị ha si dị asaa asaa, oke na nwunye. Otu a kwa, kpọrọkwa ụmụ anụmanụ ndị a gụrụ dịka ndị na-adịghị ọcha, dịka ụdị ha si dị, abụọ abụọ, oke na nwunye, na ụmụ anụ ufe asaa asaa, dịka ụdị ha si dị, oke na nwunye, maka idebe ụdị ndị a niile ndụ nʼụwa. Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.” Ya mere, Noa mere ihe niile ONYENWE ANYị nyere ya nʼiwu. Noa gbara narị afọ isii mgbe mmiri ukwu a bidoro izo nʼelu ụwa. Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya ndị ikom ịgbanarị uju mmiri ahụ. Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa, oke na nwunye, bịakwutere Noa soro ya banye nʼụgbọ mmiri ahụ, dịka Chineke nyere Noa nʼiwu. Mgbe abalị asaa gafere, uju mmiri ahụ bịakwasịrị ụwa.
JENESIS 7:1-10 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we si Noa, Ba n'ub͕ọ ahu, gi onwe-gi na ulo-gi nile; n'ihi na gi ka M'huworo bu onye ezi omume n'irum n'ọb͕ọ a. Nime anu nile ọ bula di ọcha i gāchiputara onwe-gi asa asa, oke na nwunye ya; chiputa kwa abua abua n'anu nādighi ọcha, oke na nwunye-ya; ufọdu kwa nime anu-ufe nke elu-igwe, asa asa, oke na nwunye: idebe nkpuru ndu n'elu uwa nile. N'ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n'uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M'gēkpochapu kwa n'elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M'meworo. Noa we me dika iwu nile si di nke Jehova nyere ya. Noa b͕ara nnù arọ na ọgu iri mb͕e iju-miri ahu di n'elu uwa. Noa we si n'iru miri nke iju-miri ahu ba n'ub͕ọ ahu, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya na nwunye nile nke umu-ya ndikom. Nime anu di ọcha, na nime anu nke nādighi ọcha, na nime anu-ufe na ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu ala, abua abua bakuru Noa n'ub͕ọ ahu, oke na nwunye, dika Chineke nyere Noa iwu. O rue, mb͕e ubọchi asa ahu gasiri, na miri nke iju-miri ahu di n'elu uwa.