Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 7

7
1Jehova we si Noa, Ba n'ub͕ọ ahu, gi onwe-gi na ulo-gi nile; n'ihi na gi ka M'huworo bu onye ezi omume n'irum n'ọb͕ọ a. 2Nime anu nile ọ bula di ọcha i gāchiputara onwe-gi asa asa, oke na nwunye ya; chiputa kwa abua abua n'anu nādighi ọcha, oke na nwunye-ya; 3ufọdu kwa nime anu-ufe nke elu-igwe, asa asa, oke na nwunye: idebe nkpuru ndu n'elu uwa nile. 4N'ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n'uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M'gēkpochapu kwa n'elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M'meworo. 5Noa we me dika iwu nile si di nke Jehova nyere ya.
6Noa b͕ara nnù arọ na ọgu iri mb͕e iju-miri ahu di n'elu uwa. 7Noa we si n'iru miri nke iju-miri ahu ba n'ub͕ọ ahu, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya na nwunye nile nke umu-ya ndikom. 8Nime anu di ọcha, na nime anu nke nādighi ọcha, na nime anu-ufe na ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu ala, 9abua abua bakuru Noa n'ub͕ọ ahu, oke na nwunye, dika Chineke nyere Noa iwu. 10O rue, mb͕e ubọchi asa ahu gasiri, na miri nke iju-miri ahu di n'elu uwa. 11N'arọ nke-nnù-na-ọgu-iri nke ndu Noa, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa, n'ubọchi ahu ka ab͕awara isi-iyi nile nke oké ob͕u-miri, emeghe-kwa-ra window nile nke elu-igwe. 12Oké miri-ozuzo ahu we di n'elu uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali. 13N'otù ubọchi ahu ka Noa, na Shem na Ham na Jefet, bú umu-ndikom Noa, na nwunye Noa, ha na nwunye nile nke umu-ya ndikom, bara n'ub͕ọ ahu; 14ha onwe-ha, na anu-ọhia nile ọ bula di iche iche, na anu-ulo nile ọ bula di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche, aha nnunu nile ọ bula. 15Ha we bakuru Noa n'ub͕ọ ahu, abua abua nime anu-aru nile nke ume nke ndu di nime ya. 16Ndi nāba n'ub͕ọ bara oke na nwunye sitere n'anu-aru nile, dika Chineke nyere ya iwu: Jehova we mechibido ya uzọ nime. 17Iju-miri ahu we di n'elu uwa ọgu ubọchi abua; miri ahu we ba uba, bulie ub͕ọ ahu, ewe si n'elu uwa bulie ya elu. 18Miri ahu di ike, ba uba nke-uku n'elu uwa; ub͕ọ ahu we nāgaghari n'elu miri. 19Miri ahu di ike nke-uku n'elu uwa; ewe kpuchie ugwu nile di elu nke di n'okpuru elu-igwe nile. 20Cubit iri na ise ka miri ahu di ike site n'elu ugwu; ewe kpuchie ugwu nile. 21Anu-aru nile nke nākpu akpu n'elu uwa we kubie ume, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia, na nime ihe nile ọ bula nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, na madu nile ọ bula: 22ihe ọ bula nke ume nke mọ nke ndu di n'oghere-imi-ya abua, nime ihe nile ọ bula nke di n'ala-ọkpọ-nku, ọ nwuru anwu. 23O we kpochapu ihe nile ọ bula di ndu nke di n'elu ala, ma madu, ma anumanu, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: ewe kpochapu ha n'uwa: ọ we fọdu nání Noa na ndi ya na ha nọ n'ub͕ọ ahu. 24Miri we di ike n'elu uwa ọgu ubọchi asa na iri.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 7: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye