Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 47:1-27

JENESIS 47:1-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Josef gara gwa Fero sị, “Nna m na ụmụnne m ejirila igwe ewu na atụrụ ha, igwe ehi ha na ihe niile ha nwere site nʼala Kenan bịa nʼebe a. Ha nọ nʼala Goshen.” Mgbe ọ gara ịgwa Fero okwu, o duuru mmadụ ise nʼetiti ụmụnne ya ndị ikom gosi ha Fero. Fero jụrụ ụmụnne ya ajụjụ sị ha, “Gịnị bụ ọrụ aka unu?” Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ atụrụ dịka nna nna anyị ha.” Ha kwukwara sị, “Anyị bịara ịnọ dịka ọbịa nʼala a nʼihi na ụnwụ a siri oke ike nʼala Kenan. O nweghị nri igwe ewu na atụrụ anyị nwere iri nʼala ahụ. Ya mere, anyị na-arịọ ka i nye ndị ohu gị ike ka ha biri nʼala Goshen.” Fero gwara Josef sị, “Nna gị na ụmụnne gị abịakwutela gị. Ha biri nʼala Goshen. Ala Ijipt dịkwa gị nʼihu. Họrọ ebe ọbụla masịrị gị nke dịkwa ezi mma nye nna gị na ụmụnne gị ka ha biri. Ka ha biri na Goshen. Ọ bụrụkwa na ị maara ndị ikom nʼetiti ha ndị nwere ike, mee ha ndị na-elekọta igwe anụ ụlọ m.” Josef kpọtara nna ya Jekọb, mee ka o guzo nʼihu Fero. Jekọb nọ nʼebe ahụ gọzie Fero. Fero jụrụ Jekọb sị, “Ị gbaala afọ ole ugbu a?” Jekọb zara Fero sị ya: “Ebiela m dịka onye ọbịa narị afọ na iri afọ atọ. Ọnụọgụgụ afọ ndị a ehighị nne, ma ha jupụtara nʼahụhụ na nsogbu. Ma a nọrubeghị m ọnụọgụgụ afọ nna m ha gbara mgbe ha biri nʼụwa dịka ọbịa.” Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ. Ya mere, Josef mere ka nna ya na ụmụnne ya biri nʼala Ijipt. O nyere ha ala kachasị mma nʼala ahụ na mpaghara Ramesis, dịka Fero nyere nʼiwu. Josef nyere nna ya na ụmụnne ya na ezinaụlọ nna ya nri dịka ọnụọgụgụ nke ụmụ ha si dị. Ma nri adịghị nʼala ahụ niile nʼihi na ụnwụ ahụ dị nnọọ njọ. Ihe siri ike nʼala Ijipt ma nʼala Kenan nʼihi ụnwụ a. Josef chịkọtara ego niile dị nʼala Ijipt, na nʼala Kenan, nke ndị mmadụ ji kwụọ ụgwọ nri ha zụrụ webata ha nʼụlọeze Fero. Mgbe ego niile dị ndị mmadụ nʼaka gwụchara nʼala Ijipt ma nʼala Kenan, ndị Ijipt niile bịakwutere Josef sị ya, “Nye anyị nri, gịnị mere anyị ga-eji nwụọ nʼihu gị? Ego anyị agwụla.” Mgbe ahụ Josef zara sị ha: “Jirinụ anụ ụlọ unu kwụọ ụgwọ nri m ga-enye unu, ebe ọ bụ na ego unu agwụla.” Ya mere, ha kpụtaara Josef anụ ụlọ ha. Josef nyere ha nri nʼọnọdụ ịnyịnya ha, na atụrụ ha, na ewu ha, na ehi, na ịnyịnya ibu ha. O were nri zụọ ha nʼafọ ahụ nʼọnọdụ anụ ụlọ ha niile. Mgbe afọ ahụ gafesịrị, ha bịakwutekwara ya nʼafọ nke ọzọ sị ya, “Anyị agaghị ezoro onyenwe anyị na ego anyị agwụla, na igwe anụ ụlọ anyị bụkwa nke gị. O nweghị ihe ọzọ fọdụrụ anyị karịa ahụ anyị na ala anyị. Gịnị mere anyị ga-eji nọọ nʼagụụ nʼihu gị? Zụrụ anyị na ala anyị nʼọnọdụ ụgwọ anyị ga-akwụ maka nri ị ga-enye anyị. Ka anyị na ala anyị bụrụ ndị ohu Fero. Nye anyị mkpụrụ ubi ka anyị dịrị ndụ ghara ịnwụ, ka ala a ghara ịbụ ihe tọgbọrọ nʼefu.” Ya mere, Josef zụtaara Fero ala Ijipt niile. Ndị Ijipt niile nʼotu nʼotu rere ala ha nʼihi oke ụnwụ ahụ dakwasịrị ha. Mgbe ahụ, ala ha niile ghọrọ nke Fero. Ya mere, Josef si otu a mee ka ndị Ijipt niile ghọọ ndị ohu Fero, site nʼotu obodo nʼala ahụ ruo na nke ọzọ ya. Ala nke Josef na-azụtaghị nʼoge a bụ naanị ala ndị nchụaja. Nʼihi na ndị nchụaja si nʼaka Fero na-enweta nri ha site nʼoge ruo nʼoge. Ha nwekwara nri na-ezuru ha site na oke ahụ Fero na-enye ha. Ya mere ha ereghị ala ha. Mgbe ahụ, Josef gwara ndị mmadụ ahụ niile okwu sị, “Lee, azụọla unu taa, zụkwaa a ala unu nye Fero. Nʼoge owuwe ihe ubi, otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe unu nwetara nʼubi unu bụ nke Fero. Deberenụ onwe unu ụzọ anọ fọdụrụ ka ọ bụrụ ihe unu ga-akụ nʼubi na ihe unu ga-eri na ihe ndị ezinaụlọ unu, na nke ụmụntakịrị unu ga-eri.” Ha zara sị ya, “Ị zọpụtala ndụ anyị. Ka anyị hụta amara nʼihu nna anyị ukwu. Anyị ga-abụ ndị ohu Fero.” Josef mere ka nke a bụrụ iwu nʼala Ijipt niile ruo taa, na Fero ga-ewe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe ọbụla si nʼala. Naanị ihe si nʼala ndị nchụaja bụ nke na-esoghị nʼiwu a. Izrel biri na Goshen nke dị nʼala Ijipt. Ha kpatara akụ hie nne, mụbaa nʼọmụmụ, ma nʼọnụọgụgụ.

JENESIS 47:1-27 Bible Nso (IGBOB)

Josef we ba, gosi Fero, si, Nnam na umu-nnem, na ìgwè ewu na aturu-ha, na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, esiwo n'ala Kenean bia; ma, le, ha nọ n'ala Goshen. O we si n'etiti umu-nne-ya nile chiri ndikom ise, guzo ha n'iru Fero. Fero we si umu-nne-ya, Gini bu ọlu unu nālu? Ha si Fero, Ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu ka ndi-orù-gi bu, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà. Ha we si Fero, Inọ dika ọbìa n'ala nka ka ayi biaworo; n'ihi na ọ dighi ihe eji azù ìgwè ewu na aturu ahu nke ndi-orù-gi nwere; n'ihi na oké unwu a di arọ́ n'ala Kenean: ub͕u a kwa, biko, ka ndi-orù-gi biri n'ala Goshen. Fero we gwa Josef okwu, si, Nna-gi na umu-nne-gi abiakutewo gi: ala Ijipt, n'iru gi ka ọ di; me ka nna-gi na umu-nne-gi biri n'ebe kachasi nma nke ala nka; ha gēbiri n'ala Goshen: ọ buru kwa na i mara, si, na ndi-dìnkpà dí n'etiti ha, i gēdo kwa ha ndi-isi anu-ulo m'nwere. Josef we me ka Jekob nna-ya bata, o guzo ya n'iru Fero: Jekob we gọzie Fero. Fero we si Jekob, Ùbọchi arọ ndu-gi di ole? Jekob we si Fero, Ubọchi arọ nke ọnọdu-ọbìam nile di ọgu arọ isi na iri: ha di ole-na-ole, jọ kwa njọ, bú ubọchi arọ ndum, ha erughi kwa ubọchi arọ ndu nke nnam-hà n'ubọchi ọnọdu-ọbia-ha. Jekob we gọzie Fero, si n'iru Fero pua. Josef we me ka nna-ya na umu-nne-ya biri n'ala, ọ nye kwa ha ihe-onwunwe n'ala Ijipt, n'ebe kachasi nma nke ala ahu, n'ala Rameses, dika Fero nyere iwu. Josef were nri zùa nna-ya, na umunne ya, na ulo nile nke nna-ya, dika ọnu-ọgugu nke umu-ntakiri si di. Nri adighi n'ala ahu nile; n'ihi na oké unwu ahu di arọ́ nke-uku, ala Ijipt na ala Kenean we nāda mbà n'ihi oké unwu ahu. Josef we chikọta ego nile anāchọta n'ala Ijipt, na n'ala Kenean, n'ọnọdu ọka ndi ahu nāzu: Josef we chita ego ahu n'ulo Fero. Ego we gwu-chapu n'ala Ijipt, na n'ala Kenean, ndi Ijipt nile we biakute Josef, si, Nye ayi nri, n'ihi gini ka ayi nānwu n'iru gi? n'ihi na ego agwuwo. Josef we si, Nyenu anu-ulo-unu; ka m'nye kwa unu nri n'ọnọdu anu-ulo-unu, ma ọ buru na ego agwu. Ha we chiri anu-ulo-ha biakute Josef: Josef we nye ha nri n'ọnọdu inyinya-ha, na n'ọnọdu anu-ulo-ha, bú ìgwè ewu na aturu, na n'ọnọdu anu-ulo-ha, bú ìgwè ehi, na n'ọnọdu inyinya-ibu-ha, we were nri nāzù ha n'arọ ahu n'ọnọdu anu-ulo-ha nile. Arọ ahu we gwu, ha we bia-kute ya n'arọ nke-abua, si ya, Ayi agaghi-ezonari onye-nwem, na ọ buru na ego agwusia, ọ buru kwa na onye-nwem nwere anu-ulo, bú anumanu-ayi, ọ dighi ihe fọduru n'iru onye-nwem, ma-ọbughi aru-ayi na ala-ayi: n'ìhi gini ka ayi nānwu n'anya-gi, ma ayi, ma ala-ayi? zuru ayi na ala-ayi n'ọnọdu nri, ayi onwe-ayi na ala-ayi gāghọ-kwa-ra Fero ndi-orù: gi nye kwa ayi nkpuru-ọghigha, ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu, ka ala we ghara kwa itọb͕ọrọ n'efù. Josef we zutara Fero ala Ijipt nile; n'ihi na ndi Ijipt rere ọhia-ha, onye ọ bula ọ re nke ya, n'ihi na oké unwu ahu siri ike n'aru ha: ala ahu we ghọ ihe Fero nwere. Ma ndi ahu, ọ mere ka ha gabiga ba n'obodo nile site n'otu nsọtu ókè-ala Ijipt rue nsọtu-ya ọzọ. Nání ala ndi-nchu-àjà ka ọ nāzu-tagh: n'ihi na ndi-nchu-àjà nwere òkè nri sitere n'ebe Fero nọ, ha ri-kwa-ra òkè-nri-ha nke Fero nyere ha; n'ihi nka ha ereghi ala-ha. Josef we si ndi ahu, Le, azutawom unu na ala-unu nye Fero ta: le, unu gēnwe nkpuru-ọghigha, unu gāgha kwa nkpuru n'ala. O gēru kwa, n'ọmume-ya, na unu gēnye Fero ọtù uzọ n'uzọ ise, uzọ anọ aburu kwa ihe unu nwere, ibu nkpuru-ọghigha nke ubi, na ibu ihe-oriri-unu, na iburu ndi nọ n'ulo-unu ihe-oriri, na iburu umu ntakiri-unu ihe-oriri. Ha si, I debewo ayi ndu: ka ayi huta amara n'iru onye-nwem, ayi gāghọrọ Fero ndi-orù. Josef we me ya ka ọ buru ukpuru bayere ala nke Ijipt rue ta, na Fero gēnwe otù uzọ n'uzọ ise; nání ala ndi-nchu-àjà nwere iche nāghọghi ihe Fero nwere. Israel we biri n'ala Ijipt, n'ala Goshen; ha we nwe ihe-onwunwe nime ya, mu kwa ọmùmù, ba uba nke-uku.