JENESIS 35:1-15
JENESIS 35:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Chineke sịrị Jekọb, “Bilie, gaa Betel, birikwa nʼebe ahụ. Wuo ebe ịchụ aja nye Chineke, onye mere ka ị hụ ya mgbe ị na-agbanarị Ịsọ nwanne gị nwoke.” Ya mere, Jekọb gwara ndị ezinaụlọ ya na ndị niile so ya sị, “Wezuganụ chi ndị ala ọzọ dị nʼetiti unu. Doonụ onwe unu ọcha, gbanweekwanụ uwe unu. Bilienụ, ka anyị gaa Betel, ebe m ga-ewu ebe ịchụ aja nye Chineke, onye zara m oku nʼụbọchị nsogbu m, ma nọnyekwara m na njem nke m gara.” Ya mere, ha nyere Jekọb chi ndị ala ọzọ niile ha ji nʼaka, na ọla niile dị ha na ntị. Jekọb chịịrị ha niile lie ha nʼokpuru osisi ook dị na Shekem. Ha biliri ije. Egwu Chineke dakwasịrị obodo niile gbara ha gburugburu. Ọ dịghị ndị chụsoro ha. Jekọb na ndị niile so ya rutere Luz, nke a na-akpọkwa Betel nke dị na Kenan. Jekọb wuru ebe ịchụ aja nʼebe a, kpọọ aha ebe ahụ El Betel, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Chineke gosiri ya onwe ya mgbe ọ na-agbanarị Ịsọ nwanne ya nwoke. Mgbe nke a gasịrị, Debọra, nwanyị lekọtara Ribeka mgbe ọ bụ nwantakịrị, nwụrụ. E liri ya nʼokpuru osisi ook dị na Betel. A kpọkwara ebe ahụ, “Osisi ook ebe ịkwa akwa.” Chineke gosiri Jekọb onwe ya ọzọ, mgbe o sitere na Padan Aram pụta, gọziekwa ya. Chineke sịrị ya, “Aha gị bụ Jekọb ma a gaghị akpọkwa gị Jekọb ọzọ, kama aha gị ga-abụ Izrel.” Ya mere ọ kpọrọ ya Izrel. Chineke sịrị ya, “Abụ m Chineke onye pụrụ ime ihe niile. Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Otu mba na igwe mba ga-esi na gị pụta. Ndị eze ga-esitekwa gị nʼahụ pụta. Ala ahụ m nyere Ebraham na Aịzik ka m na-enyekwa gị. Aga m enyekwa ya ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị.” Emesịa, Chineke si nʼebe ahụ ha nọ kparịtaa ụka pụọ. Jekọb wuru ogidi nkume nʼebe ahụ Chineke nọ gwa ya okwu. Ọ wụsara onyinye ihe ọṅụṅụ wụkwasịkwa mmanụ nʼelu ogidi nkume ahụ. Jekọb kpọrọ ebe ahụ ya na Chineke nọ kparịtaa ụka Betel.
JENESIS 35:1-15 Bible Nso (IGBOB)
Chineke we si Jekob, Bilie, rigoro Betel, biri n'ebe ahu: mekwara Chineke ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, bú Onye mere ka i hu Ya anya mb͕e ināb͕apu n'iru Isọ nwa-nne-gi. Jekob we si ulo-ya, ọ si kwa ndi nile ya na ha bi, Wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n'etiti unu, menu onwe-unu ka unu di ọcha, b͕anwe-kwa-nu uwe-unu: ka ayi bili kwa, rigoro Bet-el; m'gēmekwara Chineke ebe-ichuaja n'ebe ahu, bú Onye nāzam n'ubọchi ahuhum, we nọyerem n'uzọ nke m'jere. Ha we nye Jekob chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n'aka-ha, na nb͕a-aka nile nke di na nti-ha; Jekob we zobe ha n'okpuru osisi terebinth nke di nso Shekem. Ha we bulie ije: ujọ nke Chineke we dikwasi obodo nile nke di ha buruburu, ha achughi kwa umu-ndikom Jekob. Jekob we biarue Luz, nke di n'ala Kenean (nke ahu bu Bet-el), ya onwe-ya na ndi nile ya na ha yikọrọ bia. O wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, kpọ ebe ahu El-bet-el: n'ihi na ebe ahu ka Chineke kpughere Onwe-ya nye ya, mb͕e ọ nab͕apu n'iru nwa-nne-ya. Debora, bú nwayi nyere Rebeka ara na nwata, we nwua, elìe ya n'okpuru Bet-el n'okpuru osisi oak: ewe kpọ aha-ya Alon-bakut. Chineke we me ka Jekob hu Ya anya ọzọ, mb͕e o siri na Padan-eram bia, Ọ gọzie ya. Chineke we si ya, Aha-gi bu Jekob: agaghi-akpọ aha-gi Jekob ọzọ, kama Israel gābu aha-gi: Ọ we kpọ aha-ya Israel. Chineke we si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile: gi mua ọmùmù ba kwa uba; mba na nkpọkọta mba gādi site na gi, ndi-eze gēsi kwa n'úkwù-gi puta; ala nke M'nyere Abraham na Aisak, gi ka M'gēnye ya, ọ bu kwa nkpuru-gi gānọchi gi ka M'gēnye ala nka. Chineke we si n'ebe ọ nọ rigo n'ebe Ọ kpayere ya uka. Jekob we guzo ogidi ọtọ n'ebe ahu ebe Ọ kpayere ya uka, bú ogidi nkume: ọ wusi àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya, wusa kwa manu n'elu ya. Jekob we kpọ aha ebe ahu ebe Chineke kpayere ya uka Bet-el.