Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 35

35
1Chineke we si Jekob, Bilie, rigoro Betel, biri n'ebe ahu: mekwara Chineke ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, bú Onye mere ka i hu Ya anya mb͕e ināb͕apu n'iru Isọ nwa-nne-gi. 2Jekob we si ulo-ya, ọ si kwa ndi nile ya na ha bi, Wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n'etiti unu, menu onwe-unu ka unu di ọcha, b͕anwe-kwa-nu uwe-unu: 3ka ayi bili kwa, rigoro Bet-el; m'gēmekwara Chineke ebe-ichuaja n'ebe ahu, bú Onye nāzam n'ubọchi ahuhum, we nọyerem n'uzọ nke m'jere. 4Ha we nye Jekob chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n'aka-ha, na nb͕a-aka nile nke di na nti-ha; Jekob we zobe ha n'okpuru osisi terebinth nke di nso Shekem. 5Ha we bulie ije: ujọ nke Chineke we dikwasi obodo nile nke di ha buruburu, ha achughi kwa umu-ndikom Jekob. 6Jekob we biarue Luz, nke di n'ala Kenean (nke ahu bu Bet-el), ya onwe-ya na ndi nile ya na ha yikọrọ bia. 7O wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, kpọ ebe ahu El-bet-el: n'ihi na ebe ahu ka Chineke kpughere Onwe-ya nye ya, mb͕e ọ nab͕apu n'iru nwa-nne-ya. 8Debora, bú nwayi nyere Rebeka ara na nwata, we nwua, elìe ya n'okpuru Bet-el n'okpuru osisi oak: ewe kpọ aha-ya Alon-bakut.
9Chineke we me ka Jekob hu Ya anya ọzọ, mb͕e o siri na Padan-eram bia, Ọ gọzie ya. 10Chineke we si ya, Aha-gi bu Jekob: agaghi-akpọ aha-gi Jekob ọzọ, kama Israel gābu aha-gi: Ọ we kpọ aha-ya Israel. 11Chineke we si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile: gi mua ọmùmù ba kwa uba; mba na nkpọkọta mba gādi site na gi, ndi-eze gēsi kwa n'úkwù-gi puta; 12ala nke M'nyere Abraham na Aisak, gi ka M'gēnye ya, ọ bu kwa nkpuru-gi gānọchi gi ka M'gēnye ala nka. 13Chineke we si n'ebe ọ nọ rigo n'ebe Ọ kpayere ya uka. 14Jekob we guzo ogidi ọtọ n'ebe ahu ebe Ọ kpayere ya uka, bú ogidi nkume: ọ wusi àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya, wusa kwa manu n'elu ya. 15Jekob we kpọ aha ebe ahu ebe Chineke kpayere ya uka Bet-el. 16Ha we si na Bet-el bulie ije; ma uzọ fọduru ibiaru Efrat: Rechel we nāmu nwa, ime nēmesi kwa ya ike mb͕e ọ nāmu nwa. 17O rue, mb͕e ime nēmesi, ya ike, na nwayi nke nēle ime siri ya, Atula egwu; n'ihi na nka bu kwa nwa-nwoke i gēnwe. 18O rue, mb͕e nkpuru-obi-ya nāpu (n'ihi na ọ nwuru), na ọ kpọrọ aha-ya Ben-oni: ma nna-ya kpọrọ ya Benjamin. 19Rechel we nwua, elìe ya n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem). 20Jekob we guzo ogidi ọtọ n'elu ílì-ya: nke ahu bu Ogidi ílì Rechel rue ta. 21Israel we bulie ije, seti ulọ ikwū ya n'ofè ulo-elu Ida. 22O rue, mb͕e Israel biri n'ala ahu, na Reuben jere dinayere Bilha, bú iko-nwayi nna-ya: Israel we nu ya.
Ma umu-ndikom Jekob di iri na abua: 23umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun: 24umu-ndikom Rechel; Josef na Benjamin: 25umu-ndikom Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi; Dan na Naftali: 26umu-ndikom Zilpa, bú nwani nējere Lia, ozi; Gad na Asha: ndia bu umu-ndikom Jekob, nke amuru nye ya na Padan-eram. 27Jekob we biakute Aisak, bú nna-ya, na Mamre, bú Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), ebe Abraham na Aisak nọrọ dika ọbìa. 28Ubọchi Aisak we buru ọgu arọ iteghete. 29Aisak we kubie ume, nwua, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ bu agadi, ubọchi-ya jukwara ya afọ: Isọ na Jekob, bú umu-ya ndikom, we lìe ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 35: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye