Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZRA 6:1-12

EZRA 6:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ya mere, Daraiọs nyere iwu ka a chọpụta nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị Babilọn ma ọ dị akwụkwọ ọbụla dị otu ahụ. Emesịa, a chọpụtara otu akwụkwọ nʼụlọeze dị na Ekbatana nʼala Midia. Nke a bụ ihe e dere nʼime akwụkwọ ahụ: Akwụkwọ ozi eze; Nʼafọ mbụ nke Sairọs bụ eze, o nyere iwu banyere ụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ebe ndị Juu na-efe Chineke. A ga-ewughachi ụlọnsọ ukwu ahụ ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja, ka a tọsiekwa ntọala ya ike. Ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-abụkwa otu ihe ahụ. Ahịrị atọ nke oke nkume ka a ga-eji tọọ ntọala ya, tinyere otu ahịrị osisi. A ga-esi nʼụlọakụ eze Sairọs kwụọ ụgwọ ihe ndị a niile. Ọzọkwa, a ga-ebughachikwa ngwongwo ọlaedo na ọlaọcha niile nke ụlọ Chineke, ndị Nebukadneza sitere nʼụlọnsọ ahụ dị nʼJerusalem buru gaa Babilọn, doghachikwa ha nʼụlọ Chineke. Mgbe a gụsịrị ya, Daraiọs zighachiri Tatenai onye na-achị Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ nọ nʼọdịda anyanwụ Yufretis ozi sị ha, Unu hapụ ha ka ha rụọ ọrụ ha. Unu egbochila owuwu ụlọ Chineke ahụ. Kwerenụ ka onyeisi ndị Juu na ndị okenye Juu wughachi ụlọ Chineke a nʼebe e wuru ya na mbụ. Ọzọ, ana m enye iwu na nke a bụ ihe unu na-aghaghị imere ndị okenye, na ndị Juu niile na-ewugharị ụlọnsọ Chineke ahụ. Ka unu site nʼụtụ isi a na-atụrụ m kwụọ ụgwọ e ji ewu ụlọ ahụ na-atụfughị oge ọbụla. Unu nye ha ihe ọbụla dịkwa ha mkpa, ụmụ oke ehi na ebule, ụmụ atụrụ, ha ga-eji chụọrọ Chineke nke eluigwe aja. Nyekwanụ ha ọka wiiti, na mmanya, na nnu, na mmanụ oliv, dịka ndị nchụaja rịọrọ, bụ ndị nọ na Jerusalem, aghaghị inye ha ihe ndị a kwa ụbọchị niile na-esepụghị aka. Ka ha nwee ike ịchụ ezi aja nye Chineke nke eluigwe, kpeekwaara mụ na ụmụ m ekpere. Ana m enye iwu na onye ọbụla ga-agbanwe okwu a, ka ehopụta osisi nʼụlọ ya jiri kwụgbuo ya. A ga-emekwa ụlọ ya ka ọ bụrụ ebe ikpofu ahịhịa. Chineke ahụ, onye mere Jerusalem ebe obibi ya, ga-ebibi eze ọbụla maọbụ mba ọbụla gbanwere iwu a, maọbụ bibie ụlọnsọ ahụ ọzọ. Ọ bụ Daraiọs na-enye iwu a. Ka onye ọbụla were ike ya niile debe ya.

EZRA 6:1-12 Bible Nso (IGBOB)

Mb͕e ahu Daraiọs, bú eze, nyere iwu, ha we chọ n'ulo akwukwọ, ebe adọbara àkù nime Babilon. Ewe chọta akwukwọ-npiakọta n'Ekbatar, n'ulo uku nke di n'ala anāchi achi, bú Midia, ma ihe-ncheta di nime ya nke edeworo otú a. N'arọ mbu nke Sairọs, bú eze, Sairọs, bú eze, nyere iwu; Ulo Chineke nime Jerusalem, ka ewue ulo ahu, bú ebe ha nāchu àjà, ka atọ kwa ntọ-ala-ya si-ike; idi-elu-ya gādi ọgu cubit atọ, obosara-ya ọgu cubit atọ; akuku atọ nke nkume nkpọrè, na otù ariri osisi ọhu: ka esi kwa n'ulo eze nye ego iji lu ọlu ahu: ọzọ kwa, ka enyeghachi ihe ọla-edo na ọla-ọcha nke ulo Chineke, bú nke Nebukadneza chiputara n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem, chita na Babilon, ka achighachi kwa ha n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem, ihe ọ bula n'ọnọdu-ya, gi dọba kwa ha n'ulo Chineke. Ub͕u a, Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, dinu n'ebe di anya site n'ebe ahu: rapunu ọlu ulo a nke Chineke; kwe ka onye-isi ndi-Ju na ndi-okenye ndi-Ju wue ulo a nke Chineke n'ọnọdu-ya. Anēsite kwa n'akam nye iwu bayere ihe unu gēme ndi-okenye ahu nke ndi-Ju iwu ulo a nke Chineke: ka eme ngwa si n'àkù eze, bú nke sitere n'utu anātu n'ofè osimiri, nye ndikom ahu ego iji lu ọlu ahu, ka ha ghara ikwusi. Ihe di kwa ha nkpà, ma umu-oke-ehi, ma ebulu, ma umu-aturu, iji churu Chineke nke elu-igwe àjà-nsure-ọku, ma ọka wheat, ma nnú, ma manya-vine, ma manu, dika okwu-ọnu ndi-nchu-àjà si di, bú ndi nọ na Jerusalem, ka ewere ya nye ha kwa-ubọchi nēmehiegh: ka ha we nēweta nso ihe ísì utọ nye Chineke nke elu-igwe, nēkpe kwa ekpere bayere ndu eze, na nke umu-ya ndikom. Anēsite kwa n'akam nye iwu, na onye ọ bula nke gāb͕anwe okwu a, ka adọputa osisi n'ulo-ya, bulie onye ahu kpọgide ya n'elu ya; ka eme kwa ulo-ya ebe-ikpofu-ahihia n'ihi nka: Chineke kwa Nke mere aha-Ya ka o biri n'ebe ahu, Ya tudà eze na ndi ọ bula nke gēseti aka-ya ib͕anwe okwu a, na ime ka ulo a nke Chineke nke di na Jerusalem la n'iyì. Mu onwem, bú Dariọs, enyewo iwu; ka ewere ngwa ngwa me ya.