Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ezra 6:1-12

Ezra 6:1-12 BIU

Ya mere, Daraiọs nyere iwu ka a chọpụta nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị Babilọn ma ọ dị akwụkwọ ọbụla dị otu ahụ. Emesịa, a chọpụtara otu akwụkwọ nʼụlọeze dị na Ekbatana nʼala Midia. Nke a bụ ihe e dere nʼime akwụkwọ ahụ: Akwụkwọ ozi eze; Nʼafọ mbụ nke Sairọs bụ eze, o nyere iwu banyere ụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ebe ndị Juu na-efe Chineke. A ga-ewughachi ụlọnsọ ukwu ahụ ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja, ka a tọsiekwa ntọala ya ike. Ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-abụkwa otu ihe ahụ. Ahịrị atọ nke oke nkume ka a ga-eji tọọ ntọala ya, tinyere otu ahịrị osisi. A ga-esi nʼụlọakụ eze Sairọs kwụọ ụgwọ ihe ndị a niile. Ọzọkwa, a ga-ebughachikwa ngwongwo ọlaedo na ọlaọcha niile nke ụlọ Chineke, ndị Nebukadneza sitere nʼụlọnsọ ahụ dị nʼJerusalem buru gaa Babilọn, doghachikwa ha nʼụlọ Chineke. Mgbe a gụsịrị ya, Daraiọs zighachiri Tatenai onye na-achị Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ nọ nʼọdịda anyanwụ Yufretis ozi sị ha, Unu hapụ ha ka ha rụọ ọrụ ha. Unu egbochila owuwu ụlọ Chineke ahụ. Kwerenụ ka onyeisi ndị Juu na ndị okenye Juu wughachi ụlọ Chineke a nʼebe e wuru ya na mbụ. Ọzọ, ana m enye iwu na nke a bụ ihe unu na-aghaghị imere ndị okenye, na ndị Juu niile na-ewugharị ụlọnsọ Chineke ahụ. Ka unu site nʼụtụ isi a na-atụrụ m kwụọ ụgwọ e ji ewu ụlọ ahụ na-atụfughị oge ọbụla. Unu nye ha ihe ọbụla dịkwa ha mkpa, ụmụ oke ehi na ebule, ụmụ atụrụ, ha ga-eji chụọrọ Chineke nke eluigwe aja. Nyekwanụ ha ọka wiiti, na mmanya, na nnu, na mmanụ oliv, dịka ndị nchụaja rịọrọ, bụ ndị nọ na Jerusalem, aghaghị inye ha ihe ndị a kwa ụbọchị niile na-esepụghị aka. Ka ha nwee ike ịchụ ezi aja nye Chineke nke eluigwe, kpeekwaara mụ na ụmụ m ekpere. Ana m enye iwu na onye ọbụla ga-agbanwe okwu a, ka ehopụta osisi nʼụlọ ya jiri kwụgbuo ya. A ga-emekwa ụlọ ya ka ọ bụrụ ebe ikpofu ahịhịa. Chineke ahụ, onye mere Jerusalem ebe obibi ya, ga-ebibi eze ọbụla maọbụ mba ọbụla gbanwere iwu a, maọbụ bibie ụlọnsọ ahụ ọzọ. Ọ bụ Daraiọs na-enye iwu a. Ka onye ọbụla were ike ya niile debe ya.