ỌPUPU 8:16-19
ỌPUPU 8:16-19 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we si Moses, Si Eron, Setipu nkpa-n'aka-gi, tie ájá nke ala, ọ gāghọ kwa anwu ntà n'ala Ijipt nile. Ha we me otú a; Eron we setipu aka-ya, ya na nkpa-n'aka-ya. tie ájá nke ala, anwu ntà ahu we di n'aru madu, na n'aru anumanu; ájá nile nke ala ghọrọ anwu ntà n'ala Ijipt nile. Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, ime ka anwu ntà puta, ma ha apugh: anwu ntà ahu we di n'aru madu, na n'aru anumanu. Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we si Fero, Nkpisi-aka Chineke ka nka bu: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.
ỌPUPU 8:16-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, ONYENWE ANYị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn, setịpụ mkpanaka gị, tie nʼaja nke ala nʼala Ijipt niile, aja ya ga-aghọ anwụ nta nke na-ata ata.” Mosis na Erọn mere nke a. Mgbe Erọn setịpụrụ aka tie mkpanaka ya nʼelu ala, anwụ nta jupụtara nʼala Ijipt niile, nʼahụ ndị mmadụ, na nʼahụ anụmanụ ha. Ndanda ndị a jupụtakwara nʼuzuzu niile dị nʼala ahụ. Ndị Ijipt na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta. Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile. Naanị ihe ndị na-eme majiki gwara Fero bụ, “Nke a bụ akaọrụ Chineke.” Ma Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ chọghị ige, ọ bụladị ndị majiki ya ntị, dịka ONYENWE ANYị kwuru na ọ ga-eme.