Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 8

8
1Jehova we si Moses, Bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova siri, Zipu ndim, ka ha we fèm. 2Ma o buru na gi onwe-gi aju izipu ha, le, Mu onwem gaje iwere awọ tie ókè-ala-gi nile: 3osimiri Nail gēnuputa awọ, nke gārigo ba n'ulo-gi, na n'ime-ulo-ndina-gi, na n'elu ihe-ndina-gi, na n'ulo ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi, na n'ite-ọku-gi nile, na n'ihe-gi i ji agwọ achicha: 4ọ bu kwa n'aru gi, na n'aru ndi-gi, na n'aru ndi-orù-gi nile, ka awọ ahu gārigo. 5Jehova we si Moses, Si Eron, Setipu aka-gi, ya na nkpa-n'aka-gi, n'elu osimiri nile, na n'elu osimiri Nail nile, na n'elu ọdọ-miri nile, me ka awọ rigota n'ala Ijipt. 6Eron we setipu aka-ya n'elu miri nile nke Ijipt; awọ we rigo, kpuchie ala Ijipt. 7Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, we me ka awọ rigo n'elu ala Ijipt. 8Fero we kpọ Moses na Eron, si, Riọnu Jehova, ka O wezuga awọ n'ebe m'nọ, na n'ebe ndim nọ; m'gēzipu kwa ndi Israel, ka ha we chuara Jehova àjà. 9Moses we si Fero, Nya isi n'arum: òle mb͕e ka m'gāriọrọ gi aririọ, riọ-kwa-ra ndi-orù-gi, riọ-kwa-ra ndi-gi, ka ekpochapu awọ n'ebe i nọ na n'ebe ulo-gi nile di? nání n'osimiri Nail ka ha gāfọdu. 10Ọ si, Echi. Ọ si, Ya di ka okwu-gi si di: ka i we mara na ọ dighi onye di ka Jehova, bú Chineke-ayi. 11Awọ gēwezuga onwe-ha n'ebe i nọ, na n'ebe ulo-gi nile di, na n'ebe ndi-orù-gi nọ, na n'ebe ndi-gi nọ; nání n'osimiri Nail ka ha gāfọdu. 12Moses na Eron we si n'ebe Fero nọ pua: Moses we tikue Jehova ntiku bayere okwu awọ nke O dorori nye Fero. 13Jehova we me dika okwu Moses si di; awọ we nwupu n'ulo nile, na n'ogige nile, na n'ubi nile. 14Ha we chikọba ha n'obo n'obo: ala ahu we nēsì ísì. 15Fero we hu na o bìwo, o we me ka obi-ya di arọ́, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.
16Jehova we si Moses, Si Eron, Setipu nkpa-n'aka-gi, tie ájá nke ala, ọ gāghọ kwa anwu ntà n'ala Ijipt nile. 17Ha we me otú a; Eron we setipu aka-ya, ya na nkpa-n'aka-ya. tie ájá nke ala, anwu ntà ahu we di n'aru madu, na n'aru anumanu; ájá nile nke ala ghọrọ anwu ntà n'ala Ijipt nile. 18Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, ime ka anwu ntà puta, ma ha apugh: anwu ntà ahu we di n'aru madu, na n'aru anumanu. 19Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we si Fero, Nkpisi-aka Chineke ka nka bu: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.
20Jehova we si Moses, Bilie n'isi-ututu, guzo onwe-gi n'iru Fero; le, ọ nāputa ije miri; i gāsi kwa ya, Otú a ka Jehova siri, Zipu ndim, ka ha we fèm. 21N'ihi na, ma ọ buru na i dighi-ezipu ndim, le, M'gaje izite n'aru gi, na n'aru ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi, na nime ulo-gi nile, odudu: ulo nile nke ndi Ijipt gēju kwa n'odudu ahu, ya na ala nke ha di n'elu ya. 22M'gēkewapu n'ubọchi ahu ala Goshen, nke ndim nēguzo n'elu ya, ya mere odudu agaghi-adi n'ebe ahu; ka i we mara na Mu onwem bu Jehova n'etiti uwa. 23M'gētiye kwa nb͕aputa n'etiti ndim na ndi-gi: echi ka ihe-iriba-ama nka gādi. 24Jehova we me otú a; odudu nke bara uba nke-uku we ba n'ulo Fero na ulo ndi-orù-ya: ọ bu kwa n'ala Ijipt nile ka ebibiri ala ahu n'ihi odudu. 25Fero we kpọ Moses na Eron, si, Jenu, chuara Chineke-unu àjà n'ala nka. 26Moses we si, O kwesighi ime otú a; n'ihi na ihe-árú ndi Ijipt ka ayi gēji chuara Jehova, bú Chineke-ayi, aja: le, àyi gēwere ihe-árú ndi Ijipt chu àjà n'anya-ha, ha agaghi-atub͕u kwa ayi na nkume? 27Ije nke ubọchi atọ ka ayi gēje n'ọzara, chu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-ayi, àjà, dika Ọ nāsi ayi me. 28Fero we si, Mu onwem gēzipu unu, ka unu we chuara Jehova, bú Chineke-unu, àjà n'ọzara; ọ bu nání na unu agaghi-eje ebe di anya nke-uku: riọrọnum aririọ. 29Moses we si, Le, Mu onwem nēsi n'ebe i nọ pua, m'gāriọ kwa Jehova ka odudu we wezuga onwe-ha n'ebe Fero nọ, na n'ebe ndi-orù-ya nọ, na n'ebe ndi-ya nọ, echi: ma ka Fero ghara ikwa emò ọzọ, n'ighara izipu ndi Israel ichuru Jehova àjà. 30Moses we si n'ebe Fero nọ pua, we riọ Jehova. 31Jehova we me dika okwu Moses si di; O we wezuga odudu n'ebe Fero nọ, na n'ebe ndi-orù-ya nọ, na n'ebe ndi-ya nọ; ọ dighi otù fọduru. 32Fero we me kwa ka obi-ya di arọ́ na mb͕e ahu, o zipughi kwa ndi Israel.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 8: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye