Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 7:1-13

ỌPUPU 7:1-13 Bible Nso (IGBOB)

Jehova we si Moses, Le, emewom i ka i ghọrọ Fero chi: Eron, bú nwa-nne-gi, gābu kwa onye-amuma-gi. Gi onwe-gi gēkwu ihe nile nke M'nēnye gi n'iwu: Eron nwa-nne-gi gāgwa kwa Fero okwu, ka ọ we zipu umu Israel n'ala-ya. Ma Mu onwem gēme ka obi Fero sie ike, M'gēme kwa ka ihe-iriba-amam na ihe-ebubem di ọtutu n'ala Ijipt. Ma Fero agaghi-ege unu nti, M'gētiye kwa akam n'aru ndi Ijipt, were kwa ikpé uku di iche iche me ka usu nile nke ndi-agha nkem, bú ndim umu Israel, si n'ala Ijipt puta. Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gēseti akam n'aru ndi Ijipt, me ka umu Israel si n'etiti ha puta. Moses na Eron we me ya; dika Jehova nyere ha iwu, otú a ka ha mere. Moses b͕ara ọgu arọ anọ, Eron b͕a-kwa-ra ọgu arọ anọ na atọ, mb͕e ha gwara Fero okwu. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, Mb͕e Fero gāgwa unu okwu, si, Merenu onwe-unu ihe-ebube: i gāsi kwa Eron, Were nkpa-n'aka-gi, tuda ya n'iru Fero, ka ọ ghọ ogologo anu. Moses na Eron we bakuru Fero, me otú a, dika Jehova nyere ha iwu: Eron we tuda nkpa-n'aka-ya n'iru Fero, na n'iru ndi-orù-ya, ọ we ghọ ogologo anu. Fero we kpọ kwa ndi mara ihe, kpọ kwa ndi-mb͕asi: ha onwe-ha kwa, bú ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt, we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a. Ha we tuda, nwoke ọ bula nkpa-n'aka-ya, ha we ghọ ogologo anu: ma nkpa-n'aka Eron lodara nkpa-n'aka-ha. Obi Fero we di ike, Ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.

ỌPUPU 7:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ahụ ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị, “Emeela m gị ka ị dịrị ka Chineke nʼebe Fero nọ. Nwanne gị Erọn ga-abụkwa onye amụma gị. Ị ga-agwa Erọn ihe niile m gwara gị. Ọ ga-ekwukwa ha nʼihu Fero, rịọọ ya ka o kwere ka ụmụ Izrel hapụ ala Ijipt. Ma aga m eme ka obi Fero sie ike. Ọ bụ ezie na m ga-eme ọtụtụ ihe ịrịbama nʼihe ebube nʼala Ijipt, ma Fero agaghị ege unu ntị. Mgbe ahụ aga m eme ka aka m bịakwasị Ijipt. Aga m esite nʼoke ọrụ nke ikpe ọmụma dị oke egwu, mee ka ndị m, Izrel, dịka usuu ha niile si dị, site nʼala Ijipt pụọ. Ndị Ijipt ga-amata nʼezie na m bụ ONYENWE ANYị, mgbe m setịpụrụ aka nʼIjipt, ma site nʼetiti ha kpọpụta ụmụ Izrel.” Mosis na Erọn mere dịka ONYENWE ANYị nyere ha iwu. Nʼoge a, mgbe ha gwara Fero okwu, Mosis agbaala iri afọ asatọ. Ma Erọn agbaala iri afọ asatọ na atọ. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis na Erọn sị, “Mgbe Fero ga-agwa unu okwu sị, ‘Meenụ ihe ebube.’ Ị ga-agwa Erọn okwu sị ya, ‘Were mkpanaka gị tụpụ ya nʼala nʼihu Fero.’ Ọ ga-aghọ agwọ.” Mgbe ahụ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero mee dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya nʼala nʼihu Fero na ndị ozi ya. Ọ ghọrọ agwọ. Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha. Onye ọbụla nʼime ha tụpụrụ mkpanaka ya, nke ghọkwara agwọ. Ma mkpanaka ahụ Erọn tụpụrụ, nke ghọrọ agwọ, loro mkpanaka ndị ahụ niile ndị Ijipt tụpụrụ. Fero nyịchiri obi ya, mee ka o sie ike. O geghị Erọn na Mosis ntị dịka Onyenwe anyị kwuru.