Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọpụpụ 7:1-13

Ọpụpụ 7:1-13 BIU

Mgbe ahụ ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị, “Emeela m gị ka ị dịrị ka Chineke nʼebe Fero nọ. Nwanne gị Erọn ga-abụkwa onye amụma gị. Ị ga-agwa Erọn ihe niile m gwara gị. Ọ ga-ekwukwa ha nʼihu Fero, rịọọ ya ka o kwere ka ụmụ Izrel hapụ ala Ijipt. Ma aga m eme ka obi Fero sie ike. Ọ bụ ezie na m ga-eme ọtụtụ ihe ịrịbama nʼihe ebube nʼala Ijipt, ma Fero agaghị ege unu ntị. Mgbe ahụ aga m eme ka aka m bịakwasị Ijipt. Aga m esite nʼoke ọrụ nke ikpe ọmụma dị oke egwu, mee ka ndị m, Izrel, dịka usuu ha niile si dị, site nʼala Ijipt pụọ. Ndị Ijipt ga-amata nʼezie na m bụ ONYENWE ANYị, mgbe m setịpụrụ aka nʼIjipt, ma site nʼetiti ha kpọpụta ụmụ Izrel.” Mosis na Erọn mere dịka ONYENWE ANYị nyere ha iwu. Nʼoge a, mgbe ha gwara Fero okwu, Mosis agbaala iri afọ asatọ. Ma Erọn agbaala iri afọ asatọ na atọ. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis na Erọn sị, “Mgbe Fero ga-agwa unu okwu sị, ‘Meenụ ihe ebube.’ Ị ga-agwa Erọn okwu sị ya, ‘Were mkpanaka gị tụpụ ya nʼala nʼihu Fero.’ Ọ ga-aghọ agwọ.” Mgbe ahụ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero mee dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya nʼala nʼihu Fero na ndị ozi ya. Ọ ghọrọ agwọ. Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha. Onye ọbụla nʼime ha tụpụrụ mkpanaka ya, nke ghọkwara agwọ. Ma mkpanaka ahụ Erọn tụpụrụ, nke ghọrọ agwọ, loro mkpanaka ndị ahụ niile ndị Ijipt tụpụrụ. Fero nyịchiri obi ya, mee ka o sie ike. O geghị Erọn na Mosis ntị dịka Onyenwe anyị kwuru.