ỌPUPU 19:1-15
ỌPUPU 19:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼọnwa nke atọ, site nʼoge ndị Izrel hapụchara obodo Ijipt, nʼụbọchị ahụ, ha bịaruru ọzara Saịnaị. Ọ bụ site na Refidim ka ha sị bịaruo ọzara Saịnaị, mee ebe obibi ha nʼebe ahụ, nʼakụkụ ugwu Saịnaị. Mosis rigooro nʼelu ugwu ahụ izute Chineke. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị sitere nʼelu ugwu ahụ kpọ Mosis oku sị ya, “Otu a ka ị ga-esi gwa ụlọ Jekọb okwu. Ị ga-akọrọ ụmụ Izrel: ‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị Ijipt, hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo, si otu a, dọtara unu onwe m. Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m, ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.” Mosis gara kpọkọta ndị okenye ndị Izrel, gwa ha okwu niile nke ONYENWE ANYị nyere ya nʼiwu. Ndị mmadụ niile a jikwa otu olu zaghachi ya sị, “Ihe ọbụla ONYENWE ANYị kwuru ka anyị ga-eme.” Mosis gwara ONYENWE ANYị ihe niile ndị Izrel kwuru. ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị, “Lee, agaje m izute gị nʼime igwe ojii gbara ọchịchịrị. Achọrọ m ka ụmụ Izrel niile were ntị ha nụrụ mgbe m ga-agwa gị okwu, ọzọkwa, ka ha kwerekwa na gị ruo mgbe niile.” Mosis gwara ndị Izrel niile okwu nke ONYENWE ANYị gwara ya. ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu ọzọ sị, “Rịdakwuru ndị m, doo ha nsọ taa na echi. Nʼihi na nke a ga-abụ nkwado ha izute m. Ka ha saa uwe ha mmiri, jikerekwa nʼụbọchị nke atọ. Nʼihi na m ga-arịdata nʼelu ugwu Saịnaị nʼihu mmadụ niile. Ị ga-akpa oke nʼebe ha na-agaghị agafe. Nye ha iwu si ha, ‘Kpacharanụ anya ka unu ghara ịbịa ugwu ahụ nso, maọbụ metụ ala ugwu ahụ aka. Nʼihi na onye ọ bụla metụrụ ugwu ahụ aka aghaghị ịnwụ.’ Agaghị emetụ onye mmebi iwu ahụ aka, kama, a ga-eji nkume tugbuo ya, maọbụ e were àkụ gbagbuo ya, maọbụ mmadụ maọbụ anụmanụ, ọ gaghị adị ndụ. Mmadụ ọbụla agaghị abịaru ugwu ahụ nso, ruo mgbe ha nụrụ opi nke a ga-afụ. Mgbe ahụ, ha nwere ike bịa nso ugwu ahụ.” Ya mere, Mosis si nʼugwu ahụ rịdakwuru ụmụ Izrel. O doo ndị mmadụ ahụ nsọ. Ha niile ji mmiri saa uwe ha. Mosis dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Jikerenụ nʼụbọchị nke atọ. Nwoke na nwanyị enwekwala mmekọrịta ọbụla.”
ỌPUPU 19:1-15 Bible Nso (IGBOB)
N'ọnwa nke-atọ mb͕e umu Israel putasiri n'ala Ijipt, n'ubọchi ahu ka ha batara n'ọzara Sainai. Ha we si na Refidim bulie ije, bata n'ọzara Sainai, we ma ulo-ikwū-ha n'ọzara ahu; Israel we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu n'iru ugwu ahu. Moses we rigokuru Chineke, Jehova we si n'ugwu ahu kpọ ya òkù, si, Otú a ka i gāsi ulo Jekob, gosi kwa umu Israel; Unu onwe-unu ahuwo ihe M'mere ndi Ijipt, ebu-kwa-ram unu n'elu nkù ugo, me ka unu biakutem. Ma ub͕u a, ọ buru na unu ege nti n'olum n'ezie, ọ buru kwa na unu edebe ọb͕ub͕a-ndum, unu gābu-kwa-ram ihe nke akam kari ndi nile: n'ihi na ọ bu Mu nwe uwa nile: unu onwe-unu gābu-kwa-ram ala-eze ndi-nchu-àjà, na mba di nsọ. Ndia bu okwu nke i gāgwa umu Israel. Moses we bia, kpọ ndi-okenye ndi Israel, tiye okwu ndia nile n'iru ha, bú nke Jehova nyere ya n'iwu. Ndi Israel nile we za n'otù, si, Ihe nile Jehova kwuru, ayi gēme ya. Moses we weghachiri Jehova okwu nile nke ndi ahu. Jehova we si Moses, Le, Mu onwem nābiakute gi n'igwe-oji b͕ara ọchichiri, ka ndim we nu mb͕e M'nākpa-yere gi uka, ọzọ kwa, ka ọ we buru gi onwe-gi ka ha gēkwere rue mb͕e ebighi-ebi. Moses we gosi Jehova okwu nile nke ndi Israel. Jehova we si Moses, Jekuru ndim, do ha nsọ ta na echi, ka ha su kwa uwe-nb͕okwasi-ha, nọ na njikere nye ubọchi nke-atọ: n'ihi na ọ bu n'ubọchi nke-atọ ka Jehova gāridata n'anya ndi Israel nile n'elu ugwu Sainai. I gākpara ndim ókè buruburu, si, Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara irigo n'ugwu a, ma ọbu imetu nsọtu-ya aka: onye ọ bula nke nēmetu ugwu a aka, aghaghi ime ka ọ nwua: ọ dighi aka gēmetu ya, n'ihi na aghaghi itub͕u ya na nkume, ma-ọbu ib͕ab͕u ya n'àkú; ma anumanu ma madu, ọ gaghi-adi ndu: n'ọfùfù-opì di anya ndi ahu gārigota n'ugwu a. Moses we si n'ugwu ahu ridakuru ndi Israel, do ndi ahu nsọ; ha we su uwe-nbokwasi-ha. Ọ si ndi Israel, Nọnu na njikere nye ubọchi nke-atọ: unu abiarula nwayi nso.