Nʼọnwa nke atọ, site nʼoge ndị Izrel hapụchara obodo Ijipt, nʼụbọchị ahụ, ha bịaruru ọzara Saịnaị. Ọ bụ site na Refidim ka ha sị bịaruo ọzara Saịnaị, mee ebe obibi ha nʼebe ahụ, nʼakụkụ ugwu Saịnaị.
Mosis rigooro nʼelu ugwu ahụ izute Chineke. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị sitere nʼelu ugwu ahụ kpọ Mosis oku sị ya, “Otu a ka ị ga-esi gwa ụlọ Jekọb okwu. Ị ga-akọrọ ụmụ Izrel: ‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị Ijipt, hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo, si otu a, dọtara unu onwe m. Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m, ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.”
Mosis gara kpọkọta ndị okenye ndị Izrel, gwa ha okwu niile nke ONYENWE ANYị nyere ya nʼiwu. Ndị mmadụ niile a jikwa otu olu zaghachi ya sị, “Ihe ọbụla ONYENWE ANYị kwuru ka anyị ga-eme.” Mosis gwara ONYENWE ANYị ihe niile ndị Izrel kwuru.
ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị, “Lee, agaje m izute gị nʼime igwe ojii gbara ọchịchịrị. Achọrọ m ka ụmụ Izrel niile were ntị ha nụrụ mgbe m ga-agwa gị okwu, ọzọkwa, ka ha kwerekwa na gị ruo mgbe niile.” Mosis gwara ndị Izrel niile okwu nke ONYENWE ANYị gwara ya.
ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu ọzọ sị, “Rịdakwuru ndị m, doo ha nsọ taa na echi. Nʼihi na nke a ga-abụ nkwado ha izute m. Ka ha saa uwe ha mmiri, jikerekwa nʼụbọchị nke atọ. Nʼihi na m ga-arịdata nʼelu ugwu Saịnaị nʼihu mmadụ niile. Ị ga-akpa oke nʼebe ha na-agaghị agafe. Nye ha iwu si ha, ‘Kpacharanụ anya ka unu ghara ịbịa ugwu ahụ nso, maọbụ metụ ala ugwu ahụ aka. Nʼihi na onye ọ bụla metụrụ ugwu ahụ aka aghaghị ịnwụ.’ Agaghị emetụ onye mmebi iwu ahụ aka, kama, a ga-eji nkume tugbuo ya, maọbụ e were àkụ gbagbuo ya, maọbụ mmadụ maọbụ anụmanụ, ọ gaghị adị ndụ. Mmadụ ọbụla agaghị abịaru ugwu ahụ nso, ruo mgbe ha nụrụ opi nke a ga-afụ. Mgbe ahụ, ha nwere ike bịa nso ugwu ahụ.”
Ya mere, Mosis si nʼugwu ahụ rịdakwuru ụmụ Izrel. O doo ndị mmadụ ahụ nsọ. Ha niile ji mmiri saa uwe ha. Mosis dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Jikerenụ nʼụbọchị nke atọ. Nwoke na nwanyị enwekwala mmekọrịta ọbụla.”