ỌPUPU 16:1-6
ỌPUPU 16:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọgbakọ ụmụ Izrel niile hapụrụ obodo Elim, jere ije bịarute nʼọzara Sin nke dị nʼetiti Saịnaị na Elim. Ha bịaruru nʼebe ahụ nʼabalị iri na ise nke ọnwa abụọ, site na mgbe ha hapụrụ Ijipt. Nʼọzara ahụ, nzukọ ahụ niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. Ụmụ Izrel gwara ha sị, “Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na ONYENWE ANYị gburu anyị nʼala Ijipt. Nʼebe ahụ ite anụ dị iche iche na-adọ nʼihu anyị, anyị na-erikwa ụdị nri ọbụla anyị chọrọ. Ugbu a, i dubatala anyị nʼọzara ka anyị niile nwụọ nʼagụụ.” ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu. Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.” Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel sị ha, “Nʼanyasị a ka unu ga-amata na ọ bụ ONYENWE ANYị dupụtara unu site nʼala Ijipt.
ỌPUPU 16:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Ha si n'Ilim bulie ije, nzukọ nile nke umu Israel we ba n'ọzara Sin, nke di n'etiti Ilim na Sainai, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-abua site n'ọpupu-ha n'ala Ijipt. Nzukọ nile nke umu Israel we tamu ntamu megide Moses, megide kwa Eron, n'ọzara ahu: umu Israel we si ha, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi nwururi n'aka Jehova n'ala Ijipt, mb͕e ayi nọduru n'akuku ite anu, mb͕e ayi rijuru nri afọ; n'ihi na unu emewo ka ayi puta ba n'ọzara nka, iwere agu me ka nkpọkọta nka nile nwua. Jehova we si Moses, Le, M'gaje ime ka nri si n'elu-igwe zoro unu dika miri; ndim gāpu, chikọta ihe nke otù ubọchi n'ubọchi-ya, ka M'we nwa ha, ma ha gēje ije n'iwum, ma-ọbu na ha agaghi-eje. O gēru kwa, n'ubọchi nke-isi, na ha gēdozi ihe nke ha nāchibata, ọ gēme kwa okpukpu abua nke ha nāchikọta kwa-ubọchi. Moses na Eron we si umu Israel nile, n'anyasi ka unu gāmara na Jehova emewo ka unu si n'ala Ijipt puta