ỌPUPU 13:17-22
ỌPUPU 13:17-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Fero mesịrị kwere ka ụmụ Izrel laa, Chineke edughị ha site nʼụzọ ahụ gafere ala ndị Filistia. Ọ bụ ezie na ụzọ ahụ dị nso karịa. Chineke mere nke a nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na ndị a ezute agha, ha nwere ike ịgbanwe obi ha tụgharịa ịlaghachi azụ nʼIjipt.” Ya mere, Chineke duuru ha ga nʼụzọ Osimiri Uhie, nke gara nʼụzọ nke ọzara. Ụmụ Izrel kwadokwara akwado ibu agha mgbe ha si nʼala Ijipt pụọ. Mosis buuru ọkpụkpụ Josef mgbe ha na-ala. Nʼihi na o mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi na ha ga-eme otu a, na-asị, “Chineke ga-eleta unu nʼezie, mgbe ahụ, unu aghaghị iburu ọkpụkpụ m si nʼebe a pụọ.” Ha si Sukọt bilie ije, maa ụlọ ikwu ha na Etam, na nsọtụ ọzara. ONYENWE ANYị ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị. Ma ogidi igwe ojii nʼehihie na ogidi ọkụ ahụ nʼabalị, ọ dịghị nke hapụrụ ọnọdụ ya nʼihu ha.
ỌPUPU 13:17-22 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e Fero zipuru ndi Israel, na Chineke edughi ha n'uzọ ala ndi Filistia, ọ bu ezie na nke ahu di nso; n'ihi na Chineke siri, Ka ndim we ghara icheghari uche mb͕e ha huru agha, we laghachi n'Ijipt: ma Chineke dughariri ndi Israel, n'uzọ ọzara, n'uzọ Oké Osimiri Uhie: umu Israel chiri ihe-ekike-agha si n'ala Ijipt rigoputa. Moses we buru ọkpukpu Josef mb͕e ọ jere: n'ihi na ọ mere ka umu Israel ṅusie iyi ike, ọ si, Chineke gēleta unu n'ezie; unu gēme kwa ka ọkpukpum so unu si n'ebe a rigopua. Ha we si na Sukot bulie ije-ha, ma ulo-ikwū-ha n'Itam, na nsọtu ọzara. Ma Jehova nēje n'iru ha n'ehihie n'ogidi igwe-oji, iduru ha n'uzọ; na n'abali n'ogidi ọku, inye ha ìhè; ka ha we nēje ehihie na abali: ogidi igwe-oji ahu n'ehihie, na ogidi ọku ahu n'abali, adighi-apu n'iru ndi Israel.