Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 13

13
1Jehova we gwa Moses okwu, si, 2Dorom nwa ọ bula eburu uzọ mu nsọ, bú nwa meghere àkpà-nwa ọ bula n'etiti umu Israel, ma n'etiti madu ma n'etiti anumanu: nkem ka ọ bu.
3Moses we si ndi Israel, Cheta ubọchi a, nke ọ bu nime ya ka unu siworo n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta; n'ihi na ike nke aka ka Jehova ji me ka unu si n'ebe a puta: agaghi-eri kwa achicha koro eko. 4Ta ka unu onwe-unu nāputa n'ọnwa Ebib. 5O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme gi ka i ba n'ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Haivait na ndi Jebus, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, na i gēfè òfùfè a n'ọnwa nka. 6Ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, ma n'ubọchi nke-asa ememe di agēmere Jehova. 7Achicha ekoghi-eko ka agēri n'ubọchi asa ahu; agaghi-ahu kwa achicha koro eko n'aka-gi, agaghi-ahu kwa ihe nēko achicha n'aka-gi n'ókè-ala-gi nile. 8I gēgosi kwa nwa-gi n'ubọchi ahu, si, Ọ bu n'ihi ihe ahu Jehova merem mb͕e m'siri n'Ijipt puta. 9Ọ gabu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama n'elu aka-gi, na ihe-ncheta n'etiti anya-gi abua, ka iwu Jehova we di n'ọnu-gi: n'ihi na aka di ike ka Jehova jiri me ka i si n'Ijipt puta. 10I gēdebe kwa ukpuru a na mb͕e-ya akara àkà kwa-arọ.
11O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme ka i ba n'ala ndi Kenean, dika Ọ ṅuru gi na nna-gi-hà iyi, mb͕e Ọ gēnye kwa gi ya, 12na i gēme ka nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa gabigara Jehova, ya na nwa ọ bula meghere àkpà-nwa, bú nwa anu-ulo muru, nke i nwere; ndi bu oké ka Jehova gēnwe. 13Ma nwa ọ bula nke inyinya-ibu nke meghere àkpà-nwa, i gēwere nwa-aturu b͕aputa ya; ma ọ buru na i b͕aputaghi ya, i gāb͕aji kwa olu-ya: ọkpara ọ bula nke madu n'etiti umu-gi ka i gab͕aputa kwa. 14O gēru kwa, mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu nka? na i gāsi ya, Ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta: 15o rue, mb͕e Fero mere ka o sie ike, bú izipu ayi, na Jehova b͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma nwa madu buru uzọ mu, ma nwa anumanu buru uzọ mu: n'ihi nka ka mu onwem nēwere nwa ọ bula meghere àkpà-nwa, bú oké, chuara Jehova àjà; ma ọkpara ọ bula nke umum, anamab͕aputa ya. 16Ọ gābu kwa ihe-iriba-ama n'elu aka-gi, na nkpọ-n'iru n'etiti anya-gi abua: n'ihi na ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n'Ijipt puta.
17O rue, mb͕e Fero zipuru ndi Israel, na Chineke edughi ha n'uzọ ala ndi Filistia, ọ bu ezie na nke ahu di nso; n'ihi na Chineke siri, Ka ndim we ghara icheghari uche mb͕e ha huru agha, we laghachi n'Ijipt: 18ma Chineke dughariri ndi Israel, n'uzọ ọzara, n'uzọ Oké Osimiri Uhie: umu Israel chiri ihe-ekike-agha si n'ala Ijipt rigoputa. 19Moses we buru ọkpukpu Josef mb͕e ọ jere: n'ihi na ọ mere ka umu Israel ṅusie iyi ike, ọ si, Chineke gēleta unu n'ezie; unu gēme kwa ka ọkpukpum so unu si n'ebe a rigopua. 20Ha we si na Sukot bulie ije-ha, ma ulo-ikwū-ha n'Itam, na nsọtu ọzara. 21Ma Jehova nēje n'iru ha n'ehihie n'ogidi igwe-oji, iduru ha n'uzọ; na n'abali n'ogidi ọku, inye ha ìhè; ka ha we nēje ehihie na abali: 22ogidi igwe-oji ahu n'ehihie, na ogidi ọku ahu n'abali, adighi-apu n'iru ndi Israel.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 13: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye