Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 33:13-29

DEUTERONOMI 33:13-29 Bible Nso (IGBOB)

Ọ we kwue ihe bayere Josef, si, Ihe Jehova nāgọzi ka ala-ya bu; Site n'ihe di oké ọnu-ahia nke elu-igwe, site n'igirigi, Site kwa n'ob͕u-miri nke nāmakpu n'okpuru. Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu, Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile. Site kwa n'isi ihe nke ugwu nke di site na mb͕e ochie, Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ugwu ntà di mb͕e ebighi-ebi. Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke uwa na ùjú-ya, Na obi-ọma nke Onye bi n'osisi ntà: Ka ngọzi ahu biakwasi n'isi Josef, Na n'opu-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya. Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya; Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa: Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa: Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim, Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase. Ọ we kwue ihe bayere Zebulun, si, Zebulun, ṅuria ọṅu n'ọpupu-gi; Isaka, ṅuri kwa ọṅu n'ulo-ikwū-gi nile. Ha gākpọ ndi nile bia n'ugwu; N'ebe ahu ka ha gāchu àjà ezi omume: N'ihi na njuputa nke oké osimiri nile ka ha gāmí dika ara, Ya na ihe nile zoro ezo nke ezoro n'ájá. Ọ we kwue ihe bayere Gad, si, Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye nēme ka Gad sa mbara: Dika nne-ọdum ka ọ nēbi, Ọ nādọka kwa ogwe-aka, ya na opu-n'isi. Ọ nāhuta-kwa-ra onwe-ya ihe mbu, N'ihi na ebe ahu ka ekpuchiri òkè onye nēnye iwu; Ọ we soro ndi-isi ndi Israel bia, Ezi omume nke Jehova ka o mere, Na ikpé-Ya nile n'ebe Israel nọ. O we kwue ihe bayere Dan, si, Dan bu nwa ọdum, Ọ nēsi na Beshan maputa. O we kwue ihe bayere Naftali, si, Naftali, onye ewere ihe-utọ me ka afọ ju gi, Onye juputa-kwa-ra na ngọzi Jehova: Gi nweta Ọdida-anyanwu na Ndida. O we kwue ihe bayere Asha, si, Onye agọziri agọzi n'umu ka Asha bu; Ka ihe-ya tọ umu-nne-ya utọ, Ka ọ zọye kwa ukwu-ya na manu. Ígwè na ọla ka akpukpọ-ukwu-gi gābu; Dika ubọchi-gi nile si di kwa, otú a ka ume-gi gādi. Ọ dighi onye di ka Chineke, gi Jeshurun, Onye elu-igwe nēbu dika inyinya n'iyere gi aka, Onye mbara-ígwé nēbu kwa nime nbili-elu-Ya. Ebe-obibi-gi ka Chineke nke di site na mb͕e ochie bu, N'okpuru ka ogwe-aka mb͕e ebighi-ebi di kwa: Ọ chupu-kwa-ra onye-iro n'iru gi, We si, Kpochapu. Israel we biri na ntukwasi-obi, Isi-iyi Jekob nání ya iche, N'ala ọka na manya-vine ọhu; Ọzọ, elu-igwe-ya nātasi igirigi. Onye ihe nile nāgara nke-ọma ka i bu, Israel: Ònye di ka gi? bú ndi Jehova zọputaworo, Onye bu ọta nke iye-aka-gi, Onye bu kwa mma-agha nke nbili-elu-gi! Ndi-iro-gi gērube kwa isi aghughọ n'okpuru gi; Gi onwe-gi gāzọkwasi kwa ebe di elu nke ha ukwu.

DEUTERONOMI 33:13-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Banyere Josef o kwuru sị, “Ka ONYENWE ANYị gọzie ala ya, ya jiri igirigi dị oke ọnụahịa nke eluigwe dị nʼelu, na ogbu mmiri dị nʼokpuru ala, na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta, na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta, na onyinye ọma niile si nʼugwu ukwu ochie, na ịba ụba ugwu ebighị ebi ndị ahụ, na onyinye ọma niile si nʼala na uju ya niile, na ihuọma onye ahụ na-ebi nʼọhịa nta ahụ na-enwu ọkụ. Ka ihe ndị a niile dịrị nʼisi Josef, nʼiku anya onye bụ nwa eze, nʼetiti ụmụnna ya. Nʼịma mma, ọ dị ka nwa oke ehi e bụ ụzọ mụọ, mpi ya dị ka mpi ehi ọhịa. Ya ka ọ ga-eji sọda mba niile ọ bụladị mba ndị ahụ dị na nsọtụ ụwa. Otu a ka iri puku kwụrụ puku ndị Ifrem dị otu a ka imerime puku ndị Manase dị.” Banyere Zebụlọn, o kwuru sị, “Ṅụrịa, gị Zebụlọn, nʼọpụpụ gị, ma gị Isaka, ṅụrịa nʼebe obibi gị. Ha ga-akpọ ndị mmadụ oku nʼelu ugwu ukwuu, nọ nʼebe ahụ chụọ aja ezi omume, ha ga-eri site nʼịba ụba nke ihe dị nʼosimiri, site nʼakụ nzuzo dị nʼaja.” Banyere Gad, o kwuru sị, “Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara. Gad na-ebi dịka ọdụm, na-adọkapụ aka maọbụ isi. Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya; oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya. Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ, o mezuru ezi ihe dị ONYENWE ANYị nʼobi, na ikpe ya niile banyere Izrel.” Banyere Dan, o kwuru sị, “Dan bụ nwa ọdụm, onye na-esi na Bashan mapụta.” Banyere Naftalị, o kwuru sị, “Naftalị bụ onye njupụta nke ihuọma ONYENWE ANYị dịrị, o jupụtakwara na ngọzị ya, ọ ga-eketa akụkụ ndịda nke iyi ukwu.” Banyere Asha, o kwuru sị, “Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ, ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ, ka o jirikwa mmanụ saa ụkwụ ya. Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe, dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị. “O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun, onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka, onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya. Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị. Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị. Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị, ‘Bibie ha!’ Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo, isi iyi mmiri Jekọb dị chịm, nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ ebe igirigi nke eluigwe na-ada. Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, gị Izrel, onye dị ka gị ndị ONYENWE ANYị zọpụtara? Ọ bụ ọta gị na onye inyeaka gị, na mma agha gị dị ebube. Ndị iro gị ga-eji egwu daa nʼihu gị, ị ga-azọdakwa ebe ha niile dị elu.”