Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 33:13-29

DEUTERONOMI 33:13-29 IGBOB

Ọ we kwue ihe bayere Josef, si, Ihe Jehova nāgọzi ka ala-ya bu; Site n'ihe di oké ọnu-ahia nke elu-igwe, site n'igirigi, Site kwa n'ob͕u-miri nke nāmakpu n'okpuru. Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu, Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile. Site kwa n'isi ihe nke ugwu nke di site na mb͕e ochie, Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ugwu ntà di mb͕e ebighi-ebi. Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke uwa na ùjú-ya, Na obi-ọma nke Onye bi n'osisi ntà: Ka ngọzi ahu biakwasi n'isi Josef, Na n'opu-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya. Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya; Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa: Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa: Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim, Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase. Ọ we kwue ihe bayere Zebulun, si, Zebulun, ṅuria ọṅu n'ọpupu-gi; Isaka, ṅuri kwa ọṅu n'ulo-ikwū-gi nile. Ha gākpọ ndi nile bia n'ugwu; N'ebe ahu ka ha gāchu àjà ezi omume: N'ihi na njuputa nke oké osimiri nile ka ha gāmí dika ara, Ya na ihe nile zoro ezo nke ezoro n'ájá. Ọ we kwue ihe bayere Gad, si, Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye nēme ka Gad sa mbara: Dika nne-ọdum ka ọ nēbi, Ọ nādọka kwa ogwe-aka, ya na opu-n'isi. Ọ nāhuta-kwa-ra onwe-ya ihe mbu, N'ihi na ebe ahu ka ekpuchiri òkè onye nēnye iwu; Ọ we soro ndi-isi ndi Israel bia, Ezi omume nke Jehova ka o mere, Na ikpé-Ya nile n'ebe Israel nọ. O we kwue ihe bayere Dan, si, Dan bu nwa ọdum, Ọ nēsi na Beshan maputa. O we kwue ihe bayere Naftali, si, Naftali, onye ewere ihe-utọ me ka afọ ju gi, Onye juputa-kwa-ra na ngọzi Jehova: Gi nweta Ọdida-anyanwu na Ndida. O we kwue ihe bayere Asha, si, Onye agọziri agọzi n'umu ka Asha bu; Ka ihe-ya tọ umu-nne-ya utọ, Ka ọ zọye kwa ukwu-ya na manu. Ígwè na ọla ka akpukpọ-ukwu-gi gābu; Dika ubọchi-gi nile si di kwa, otú a ka ume-gi gādi. Ọ dighi onye di ka Chineke, gi Jeshurun, Onye elu-igwe nēbu dika inyinya n'iyere gi aka, Onye mbara-ígwé nēbu kwa nime nbili-elu-Ya. Ebe-obibi-gi ka Chineke nke di site na mb͕e ochie bu, N'okpuru ka ogwe-aka mb͕e ebighi-ebi di kwa: Ọ chupu-kwa-ra onye-iro n'iru gi, We si, Kpochapu. Israel we biri na ntukwasi-obi, Isi-iyi Jekob nání ya iche, N'ala ọka na manya-vine ọhu; Ọzọ, elu-igwe-ya nātasi igirigi. Onye ihe nile nāgara nke-ọma ka i bu, Israel: Ònye di ka gi? bú ndi Jehova zọputaworo, Onye bu ọta nke iye-aka-gi, Onye bu kwa mma-agha nke nbili-elu-gi! Ndi-iro-gi gērube kwa isi aghughọ n'okpuru gi; Gi onwe-gi gāzọkwasi kwa ebe di elu nke ha ukwu.