Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 32:1-43

DEUTERONOMI 32:1-43 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Gee ntị, gị eluigwe, nụrụ ihe m na-ekwu! Gee ntị, ụwa, nụrụ okwu si m nʼọnụ. Ka okwu m daa dịka mmiri ozuzo ka okwu m daa dịka igirigi, ka ọ daa dịka nshansha mmiri nʼelu ahịhịa, dịka oke mmiri ozuzo nʼahịhịa na-epupụta epupụta. Aga m eto aha ONYENWE ANYị toonu ịdị ukwuu Chineke anyị! Ọ bụ oke nkume ahụ, ọrụ ya zuruoke, ụzọ ya niile ziri ezi. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, nke na-adịghị eme ihe ọjọọ, onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ. Ha emerụọla onwe ha, ha abụkwaghị ụmụ ya, ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ndị ụdịdị ha gbanwere agbanwe Ọ bụ otu a ka unu si emeso ONYENWE ANYị unu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche? ONYENWE ANYị ọ bụghị nna unu, onye kere unu, onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike? Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga, tulee ọgbọ ndị ahụ gara aga jụọ nna gị, ọ ga-akọrọ gị. Jụọ ndị okenye gị, ha ga-eme ka o doo gị anya. Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha, mgbe o kesara ụmụ mmadụ, mgbe o guzobere oke ala nye ndị niile dịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị. Nʼihi na oke ONYENWE ANYị nwetara bụ ndị ya Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya. Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya, nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ. O kpuchitere ya, lezie ya anya, o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya, dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya, nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya, nke na-agbasapụ nku ya ijide ha, nke na-ebu ha na nku ya, ONYENWE ANYị naanị ya duru ya, chi ala ọzọ esokwaghị ya. O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ, jiri mkpụrụ na-amị nʼala ubi ahụ zụọ ya. O ji mmanụ aṅụ si na nkume zụọ ya, ya na mmanụ si nʼoke nkume, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ, na ụmụ atụrụ na mkpi gbara abụba, na oke ebule Bashan dị ezi mma, tinyere ezi obi ọka wiiti. Ị ṅụkwara mmanya na-agbọ ụfụfụ, nke bụ ọbara mkpụrụ vaịnị. Ma Jeshurun mara abụba, ma gbagharịa ụkwụ ya, ebe nri juru ya ọnụ, o buru ibu, maa mma ile anya. Ọ hapụrụ Chineke kpụrụ ya, jụ oke nkume ahụ, bụ Onye Nzọpụta ya. Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya, meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha. Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke, bụ chi ndị ha na-amaghị, chi ndị ka pụtara ọhụrụ, chi ndị ahụ nna nna ha na-atụghị ụjọ ha. Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ, i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị. ONYENWE ANYị hụrụ ihe dị otu a, jụ ha, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom kpasuru ya iwe. “Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru, “ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ, nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi. Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m, jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m. Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha, sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya. Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m, ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa. Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile, ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile. “Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha, zipụ àkụ m niile megide ha. Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha, na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu. Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha, na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya. Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha. Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi, ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ. Ekwuru m na m ga-achụsasị ha, hichapụ ncheta ọbụla banyere ha nʼetiti ụmụ mmadụ. Ma ihe banyere ịnya isi onye iro tinyere m ụjọ nʼobi, ka onye iro ghara ịghọtahie kwuo sị, ‘Aka anyị ewetarala anyị mmeri, ọ bụghị ONYENWE ANYị mere ihe ndị a niile.’ ” Ha bụ mba na-enweghị uche, ndị na-enweghị mmụọ nghọta ọbụla nʼime ha. A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche nakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ. Kedụ ka otu onye ga-esi chụọ otu puku mmadụ ọsọ, kedụ ka mmadụ abụọ ga-esi chụọ iri puku mmadụ ọsọ, ma ọ bụghị na Oke Nkume ha erefuola ha, ma ọ bụghị na ONYENWE ANYị echepụla ihu ya nʼebe ha nọ? Nʼihi na nkume ha adịghị ka Nkume anyị, dịka ndị iro anyị, nʼonwe ha, jiri ọnụ ha kwuo. Osisi vaịnị ha si nʼosisi vaịnị Sọdọm, na nʼubi dị na Gọmọra mkpụrụ vaịnị ha jupụtara na nsi, ụyọkọ vaịnị ha jupụtara nʼilu ilu. Mmanya vaịnị ha bụ elo agwọ, elo ajụala na-ebute ọnwụ. “Nke a ọ bụghị ihe m dokọtarala chere oge, chezie ha nke ọma nʼụlọakụ m? Ọ bụ m ka ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi. Mgbe oge ruru ụkwụ ha ga-agbuchapụ, ụbọchị mbibi ha na-abịa nso, ịla nʼiyi ha chị ọsọ na-abịakwasị ha.” ONYENWE ANYị ga-ekpe ndị ya ikpe, ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị ohu ya, mgbe ọ hụrụ na ike ha nwere agwụla, mgbe otu onye na-agaghị afọdụ, ohu na onye nwe onwe ya. Ọ ga-asịkwa, “Ugbu a, olee ebe chi niile ha nọ, bụ oke nkume ahụ ha gbabara izere ndụ nʼime ya, chi ndị ahụ riri abụba ihe ịchụ aja ha, ṅụọkwa mmanya ha ji chụọ aja ihe ọṅụṅụ? Ha bilie bịa nyere unu aka! Ha bụrụ ụlọ ndo nye unu!” “Ugbu a, hụnụ na mụ onwe m abụ m ya! Ọ dịghịkwa chi ọzọ dị ma ọ bụghị m. Mụ onwe m na-eme ka a nwụọ, mụ onwe m na-eme ka a dị ndụ. Mụ onwe m na-etipụ mmadụ ọnya, mụ onwe m na-agwọ ya, mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụta onye m ji nʼaka m. Ana m eweli aka nʼeluigwe na-ekwupụta nʼịnụ iyi sị, dịka m na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, mgbe m mụrụ mma agha m na-egbu amụma, mgbe aka m jidere mma agha ahụ nʼọnọdụ ikpe ikpe, aga m abọ ọbọ megide ndị iro, kwụghachi ndị ahụ niile kpọrọ m asị. Aga m eme ka àkụ m ṅụjuo ọbara afọ, ma mma agha ga-ebibi anụ ahụ, ọbara ndị e gburu egbu, na nke ndị a dọtara nʼagha, na isi ndị ndu ndị iro.” Ṅụrịanụ ọṅụ mba niile, unu na ndị ya, nʼihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya, ọ ga-abọ ọbọ megide ndị iro ya, kpuchiere ala ya na ndị ya mmehie ha.

DEUTERONOMI 32:1-43 Bible Nso (IGBOB)

Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m'kwu kwa ihe; Ka uwa nu kwa okwu ọnum: Nmutam gātasi dika miri-ozuzo, Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi; Dika nshansha-miri n'elu ahihia ndu, Di kwa ka oké miri-ozuzo n'elu ihe-ọkukú: N'ihi na aha Jehova ka m'gākpọsa: Nyenu Chineke-ayi idi-uku. Oké nkume ahu, ihe zuru okè ka ọlu-Ya bu: N'ihi na uzọ-Ya nile bu ikpé ziri ezi: Chineke Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke nēnweghi ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bu. Ha ebibiwo onwe-ha, ọ bughi nke umu-Ya ka ọlu nke di ha n'aru bu. Ha bu ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke rọ-kwa-ra arọ. Ùnu nēnyeghachi Jehova otú a, Unu ndi-nzuzu ndi nāmaghi ihe? Ọ̀ bughi ya onwe-ya bu nna-gi onye nwetaworo gi? Ya onwe-ya emewo gi, me kwa ka i guzosie ike. Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ: Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi; Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi. Mb͕e Onye kachasi ihe nile elu mere ka mba nile keta ihe-ha, Mb͕e O kesara umu madu, O guzoro ókè nile nke ndi nile Dika ọnu-ọgugu umu Israel si di. N'ihi na òkè Jehova bu ndi-Ya; Jekob bu akuku ihe-nketa-Ya. Ọ chọtara ya n'ala ọzara, Na n'ihe tọb͕ọrọ nkití, bú ala tọb͕ọrọ n'efu nke nāb͕ọ uja. Ọ nāb͕a ya buruburu, Ọ nēme ka ọ ghọta ihe, Ọ nēchezi ya dika nwantanta anya-Ya: Dika ugo nākpọte umu di n'akwu-ya, Nērughari n'elu umu-ya, Nāb͕asa nkù-ya, nāghọrọ ha, Nēbu ha n'elu nkù-ya: Otú a Jehova, nání Ya, nēdu ya, Ọ dighi kwa chi ala ọzọ diyere ya. Ọ nēme ka ebe di elu nke uwa būru ya dika inyinya, Ọ we rie ihe-ọmume nke ubi; O me-kwa-ra ya ka ọ mia manu-aṅu site na nkume di elu, Na manu site n'oké nkume ọ́mú; Miri-ara nke raru araru nke ìgwè ehi, na miri-ara nke ìgwè ewu na aturu, Ya na abuba umu-aturu, Na ebulu àb͕ọ̀ Beshan, na ewu, Tiyere abuba obi ọka wheat; Ọbara nkpuru-vine ka i nāṅu kwa, bú manya-vine. Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu. Ha nēwere ndi ala ọzọ me ka O kwo ekworo, Ha nēwere ihe-árú di iche iche kpasue Ya iwe. Ha nāchuru ndi-mọ ọjọ aja, ndi nābughi Chineke, Bú chi ha nāmaghi, Ndi ọhu ndi si n'ebe di nso bata, Ndi nna-unu-hà nātughi ujọ. Oké Nkume ahu nke muru gi ka i nēchefu, I chezọwo kwa Chineke nke muputara gi. Jehova we hu ya, we lelia ha anya, N'ihi nkpasu-iwe nke umu-Ya ndikom na umu-Ya ndinyom. O we si, Ka M'zopu irum n'ebe ha nọ, M'gāhu ihe gābu ikpe-azu-ha: N'ihi na ọb͕ọ nke nāb͕akuta azu ka ha bu, Umu ndi nēkwesighi okwukwe. Ha onwe-ha ewerewo ihe nābughi Chineke mem ka M'kwo ekworo; Ha ewerewo ihe-efu nile ha kpasuem iwe: Mu onwem gēwere kwa ndi nābughi ndi me ha ka kwo ekworo; Mba nzuzu ka M'gēwere kpasue ha iwe. N'ihi na amuyewo ọku n'iwem, Ọ nēre kwa rue ala-mọ nke dichasi ala, Ọ nēripia kwa uwa na ihe-ọmume-ya, Nēme kwa ka ntọ-ala nile nke ugwu nile nwuru ọku. M'gēkpokwasi kwa ha ihe ọjọ; M'gāb͕apusi àkúm nile n'aru ha: Ha gābu ndi tara aru n'agu, na ndi nruru-ọku rub͕uworo, Ya na nbipu di ilu; Ezé anumanu ka M'gēzikwasi kwa ha, Ya na edide nke ihe nākpu akpu nke ájá. Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí, Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile; Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ. Asiwom, M'gāfupu ha, Me ka ncheta-ha kwusi n'etiti madu: Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro, Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie, Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu, Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile. N'ihi na mba nke furu efu n'ebe idu-ọdu di ka ha bu, Nghọta adighi kwa nime ha. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka, Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha! Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri, Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga, Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha, Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ? N'ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi, Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe. N'ihi na ọ bu n'osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere, Site kwa n'ubi Gọmọra: Nkpuru-vine-ha bu nkpuru-vine ńsí, Uyọkọ di ilu ka ha nwere: Edide agwọ di ogologo ka manya-vine-ha bu, Na ńsí di irè nke aju-ala. Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n'ebe m'nọ, Ihe akaworo akàrà n'ulo-àkùm? Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi, Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu: N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso, Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa. N'ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya, Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya; Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo, Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru. Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ? Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya; Nke nēri abuba àjà nile ha, Nāṅu kwa manya-vine nke àjà-ihe-ọṅuṅu-ha; Ka ha bilie, yere unu aka, Ka ọ buru ebe-nzuzo n'elu unu. Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya, Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ: Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu; M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike: Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam. N'ihi na anameweli akam elu nye elu-igwe, We si, Mu onwem nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi, Ọ buru na amuam mma-agham nēb͕upu àmùmà, O buru kwa na akam ejide ikpé; M'gābọghachi ọ́bọ̀ n'aru ndi nēmegidem, M'gākwughachi kwa ndi nākpọm asi. M'gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè, Mma-agham gēri kwa anu-aru; Site n'ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n'agha, Site n'isi ndundu onye-iro. Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu: N'ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya, Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n'aru ndi nēmegide Ya, O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya.