Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 32

32
1Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m'kwu kwa ihe;
Ka uwa nu kwa okwu ọnum:
2Nmutam gātasi dika miri-ozuzo,
Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi;
Dika nshansha-miri n'elu ahihia ndu,
Di kwa ka oké miri-ozuzo n'elu ihe-ọkukú:
3N'ihi na aha Jehova ka m'gākpọsa:
Nyenu Chineke-ayi idi-uku.
4Oké nkume ahu, ihe zuru okè ka ọlu-Ya bu:
N'ihi na uzọ-Ya nile bu ikpé ziri ezi:
Chineke Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke nēnweghi ajọ omume,
Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bu.
5Ha ebibiwo onwe-ha, ọ bughi nke umu-Ya ka ọlu nke di ha n'aru bu.
Ha bu ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke rọ-kwa-ra arọ.
6Ùnu nēnyeghachi Jehova otú a,
Unu ndi-nzuzu ndi nāmaghi ihe?
Ọ̀ bughi ya onwe-ya bu nna-gi onye nwetaworo gi?
Ya onwe-ya emewo gi, me kwa ka i guzosie ike.
7Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga,
Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ:
Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi;
Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi.
8Mb͕e Onye kachasi ihe nile elu mere ka mba nile keta ihe-ha,
Mb͕e O kesara umu madu,
O guzoro ókè nile nke ndi nile
Dika ọnu-ọgugu umu Israel si di.
9N'ihi na òkè Jehova bu ndi-Ya;
Jekob bu akuku ihe-nketa-Ya.
10Ọ chọtara ya n'ala ọzara,
Na n'ihe tọb͕ọrọ nkití, bú ala tọb͕ọrọ n'efu nke nāb͕ọ uja.
Ọ nāb͕a ya buruburu, Ọ nēme ka ọ ghọta ihe,
Ọ nēchezi ya dika nwantanta anya-Ya:
11Dika ugo nākpọte umu di n'akwu-ya,
Nērughari n'elu umu-ya,
Nāb͕asa nkù-ya, nāghọrọ ha,
Nēbu ha n'elu nkù-ya:
12Otú a Jehova, nání Ya, nēdu ya,
Ọ dighi kwa chi ala ọzọ diyere ya.
13Ọ nēme ka ebe di elu nke uwa būru ya dika inyinya,
Ọ we rie ihe-ọmume nke ubi;
O me-kwa-ra ya ka ọ mia manu-aṅu site na nkume di elu,
Na manu site n'oké nkume ọ́mú;
14Miri-ara nke raru araru nke ìgwè ehi, na miri-ara nke ìgwè ewu na aturu,
Ya na abuba umu-aturu,
Na ebulu àb͕ọ̀ Beshan, na ewu,
Tiyere abuba obi ọka wheat;
Ọbara nkpuru-vine ka i nāṅu kwa, bú manya-vine.
15Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu:
I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi:
O we rapu Chineke nke mere ya,
We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.
16Ha nēwere ndi ala ọzọ me ka O kwo ekworo,
Ha nēwere ihe-árú di iche iche kpasue Ya iwe.
17Ha nāchuru ndi-mọ ọjọ aja, ndi nābughi Chineke,
Bú chi ha nāmaghi,
Ndi ọhu ndi si n'ebe di nso bata,
Ndi nna-unu-hà nātughi ujọ.
18Oké Nkume ahu nke muru gi ka i nēchefu,
I chezọwo kwa Chineke nke muputara gi.
19Jehova we hu ya, we lelia ha anya,
N'ihi nkpasu-iwe nke umu-Ya ndikom na umu-Ya ndinyom.
20O we si, Ka M'zopu irum n'ebe ha nọ,
M'gāhu ihe gābu ikpe-azu-ha:
N'ihi na ọb͕ọ nke nāb͕akuta azu ka ha bu,
Umu ndi nēkwesighi okwukwe.
21Ha onwe-ha ewerewo ihe nābughi Chineke mem ka M'kwo ekworo;
Ha ewerewo ihe-efu nile ha kpasuem iwe:
Mu onwem gēwere kwa ndi nābughi ndi me ha ka kwo ekworo;
Mba nzuzu ka M'gēwere kpasue ha iwe.
22N'ihi na amuyewo ọku n'iwem,
Ọ nēre kwa rue ala-mọ nke dichasi ala,
Ọ nēripia kwa uwa na ihe-ọmume-ya,
Nēme kwa ka ntọ-ala nile nke ugwu nile nwuru ọku.
23M'gēkpokwasi kwa ha ihe ọjọ;
M'gāb͕apusi àkúm nile n'aru ha:
24Ha gābu ndi tara aru n'agu, na ndi nruru-ọku rub͕uworo,
Ya na nbipu di ilu;
Ezé anumanu ka M'gēzikwasi kwa ha,
Ya na edide nke ihe nākpu akpu nke ájá.
25Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí,
Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile;
Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke,
Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.
26Asiwom, M'gāfupu ha,
Me ka ncheta-ha kwusi n'etiti madu:
27Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro,
Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie,
Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu,
Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile.
28N'ihi na mba nke furu efu n'ebe idu-ọdu di ka ha bu,
Nghọta adighi kwa nime ha.
29Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka,
Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha!
30Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri,
Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga,
Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha,
Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ?
31N'ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi,
Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe.
32N'ihi na ọ bu n'osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere,
Site kwa n'ubi Gọmọra:
Nkpuru-vine-ha bu nkpuru-vine ńsí,
Uyọkọ di ilu ka ha nwere:
33Edide agwọ di ogologo ka manya-vine-ha bu,
Na ńsí di irè nke aju-ala.
34Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n'ebe m'nọ,
Ihe akaworo akàrà n'ulo-àkùm?
35Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi,
Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu:
N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso,
Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.
36N'ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya,
Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya;
Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo,
Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru.
37Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ?
Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya;
38Nke nēri abuba àjà nile ha,
Nāṅu kwa manya-vine nke àjà-ihe-ọṅuṅu-ha;
Ka ha bilie, yere unu aka,
Ka ọ buru ebe-nzuzo n'elu unu.
39Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya,
Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ:
Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu;
M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike:
Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam.
40N'ihi na anameweli akam elu nye elu-igwe,
We si, Mu onwem nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi,
41Ọ buru na amuam mma-agham nēb͕upu àmùmà,
O buru kwa na akam ejide ikpé;
M'gābọghachi ọ́bọ̀ n'aru ndi nēmegidem,
M'gākwughachi kwa ndi nākpọm asi.
42M'gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè,
Mma-agham gēri kwa anu-aru;
Site n'ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n'agha,
Site n'isi ndundu onye-iro.
43Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu:
N'ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya,
Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n'aru ndi nēmegide Ya,
O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya.
44Moses we bia, kwue okwu nile nke abù a na nti ndi Israel, ya onwe-ya, na Hoshea nwa Nun. 45Moses we gwabìe Israel nile okwu nile ndia: 46o we si ha, Tukwasi obi-unu n'okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n'iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a. 47N'ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n'ebe unu nọ; n'ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n'elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya.
48Jehova we gwa Moses okwu n'otù ubọchi ahu, si, 49Rigo n'ugwu a nke Abarim, bú ugwu Nebo, nke di n'ala Moab, nke di n'irú Jeriko; le kwa ala Kenean anya, bú nke Mu onwem nēnye umu Israel n'ihe-onwunwe: 50gi nwu kwa n'ugwu ahu ebe i nārigo, ka achikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ; dika Eron, bú nwa-nne-gi, nwuru n'ugwu Hoa, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ: 51n'ihi na unu mekpuru ihe-nmekpu megidem n'etiti umu Israel na miri Meriba Kedesh, n'ọzara Zin; n'ihi na unu edoghm nsọ n'etiti umu Israel. 52N'ihi na ọ bu na ncherita-iru ka i gāhu ala ahu; ma i gaghi-abà n'ebe ahu n'ala ahu nke Mu onwem nēnye umu Israel.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

DEUTERONOMI 32: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye