Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DANIEL 3:1-7

DANIEL 3:1-7 Bible Nso (IGBOB)

Nebukadneza, bú eze, mere onyinyo ọla-edo, idi-elu-ya bu ọgu cubit atọ, obosara-ya bu cubit isi: ọ guzobere ya ọtọ na ndagwurugwu Dura n'ala-ọchichi Babilon. Nebukadneza, bú eze, zi-kwa-ra ka achikọta ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi, na ndi nāchi achi, na ndi-ikpé, na ndi-odozi-àkù, na ndi-ndum-ọdu, na ndi-odozi-okwu, na ndi nile nāchi ala anāchi achi, ibia n'irara onyinyo ahu nye, bú nke Nebukadneza, bú eze, guzobeworo ọtọ. Mb͕e ahu ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi, na ndi nāchi achi, na ndi-ikpe, na ndi-odozi-àkù, na ndi-ndum-ọdu, na ndi-odozi-okwu, na ndi nile nāchi ala anāchi achi, nēzukọta n'irara onyinyo ahu nye, bú nke Nebukadneza, bú eze, guzobere ọtọ; ha we nēguzo ọtọ n'iru onyinyo ahu nke Nebukadneza guzobere. Onye-nkwusa nākpọsi kwa nkpu ike, si, Ọ bu unu ka anāgwa okwu, unu ndi di iche iche, na unu mba di iche iche, na unu ndi nāsu asusu di iche iche, si, Na mb͕e ahu mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala, kpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu nke Nebukadneza, bú eze, guzobeworo ọtọ: ma onye ọ bula nke nāgaghi-ada n'ala kpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà ya n'etiti oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu. N'ihi nka, n'otù mb͕e ahu, mb͕e ndi nile di iche nuru olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke ubọ na opì nile di iche iche, ha we nāda n'ala, bú ndi nile di iche iche, na mba nile di iche iche, na ndi nile nāsu asusu di iche iche, ha we nākpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu nke Nebukadneza, bú eze, guzobere ọtọ.

DANIEL 3:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Eze Nebukadneza kpụrụ oyiyi ọlaedo nke ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-adị ka mita atọ. Emesịa, o debe ya nʼobosara ala Dura, nke dị nʼotu mpaghara Babilọn. Eze Nebukadneza ziri ozi ka e zie ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile, ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, ka ha bịa nʼụbọchị a ga-edo oyiyi ahụ nsọ bụ nke eze Nebukadneza guzobere. Ya mere, ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile na ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, zukọtara maka ido oyiyi ahụ nke eze, bụ Nebukadneza guzobere nsọ. Ha niile guzooro ọtọ nʼihu oyiyi ahụ bụ nke eze Nebukadneza guzobere. Onye nkwusa kwuru okwu nʼolu ike, “Mmadụ niile si na mba niile na asụsụ niile dị iche iche bịa, ka a na-enye iwu nke a, mgbe ọbụla unu nụrụ ụda ọja, une, ụbọ akwara, maọbụ ụda ihe egwu ọbụla, unu ga-ada nʼala kpọọ isiala nye ihe a Nebukadneza eze ji ọlaedo kpụọ. Onye ọbụla juru ịkpọ isiala ka a ga-atụba ngwangwa nʼime ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.” Ya mere, ngwangwa ha nụrụ ụda opi ike, nke ọja, une ụbọ akwara, nke une na nke egwu dị iche iche, ndị niile si mba dị iche iche, ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, dara nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ, nke eze bụ Nebukadneza guzobere.