Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Daniel 3:1-7

Daniel 3:1-7 BIU

Eze Nebukadneza kpụrụ oyiyi ọlaedo nke ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-adị ka mita atọ. Emesịa, o debe ya nʼobosara ala Dura, nke dị nʼotu mpaghara Babilọn. Eze Nebukadneza ziri ozi ka e zie ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile, ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, ka ha bịa nʼụbọchị a ga-edo oyiyi ahụ nsọ bụ nke eze Nebukadneza guzobere. Ya mere, ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile na ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, zukọtara maka ido oyiyi ahụ nke eze, bụ Nebukadneza guzobere nsọ. Ha niile guzooro ọtọ nʼihu oyiyi ahụ bụ nke eze Nebukadneza guzobere. Onye nkwusa kwuru okwu nʼolu ike, “Mmadụ niile si na mba niile na asụsụ niile dị iche iche bịa, ka a na-enye iwu nke a, mgbe ọbụla unu nụrụ ụda ọja, une, ụbọ akwara, maọbụ ụda ihe egwu ọbụla, unu ga-ada nʼala kpọọ isiala nye ihe a Nebukadneza eze ji ọlaedo kpụọ. Onye ọbụla juru ịkpọ isiala ka a ga-atụba ngwangwa nʼime ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.” Ya mere, ngwangwa ha nụrụ ụda opi ike, nke ọja, une ụbọ akwara, nke une na nke egwu dị iche iche, ndị niile si mba dị iche iche, ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, dara nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ, nke eze bụ Nebukadneza guzobere.