NDI KỌLỌSI 2:1-5
NDI KỌLỌSI 2:1-5 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na anamachọ ka unu mata otú m'nāb͕asi nb͕a ike nke-uku n'ihi unu na ndi bi na Leọdisia na ka ha ra, bú ndi akāhughi irum n'anu-aru; ka ewe kasie obi-ha, ebe ejikọ-kwa-ra ha n'ihu-n'anya, ka ha we ru kwa àkù nile nke nkwezu ahu nke nghọta nēkwezu, ka ha we mazu ihe-omimi nke Chineke, bú Kraist, Onye àkù nile nke amam-ihe na ihe-ọmuma di nime Ya, bú ihe zoro ezo nime Ya. Nka ka m'nēkwu, ka onye ọ bula we ghara iwere ire-utọ rafue unu. N'ihi na ọ bu ezie na anọghm n'etiti unu n'anu-arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, nāṅuri, nēle kwa usoro-unu na otú okwukwe unu kwere na Kraist di ike.
NDI KỌLỌSI 2:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ ọchịchọ m ka unu ghọta otu m si na-agbasi mgba ike nke ukwuu nʼihi unu, na nʼihi ndị nọ nʼobodo Laodisia, na ndị niile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu. Ebumnobi m bụ ka a gbaa ha ume, jikọọkwa ha nʼotu nʼịhụnanya, ka ha nweta ụba niile nke nghọta zuruoke na amamihe nke ihe omimi Chineke ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya. Ọ bụkwa nʼime ya ka ụlọakụ ihe zoro ezo niile nke amamihe na ihe ọmụma dị. Ana m ekwu nke a ka onye ọbụla ghara iji ire ụtọ duhie unu ụzọ. Ọ bụ ezie na anọghị m nʼetiti unu nʼanụ ahụ, ma anọ m nʼetiti unu nʼime mmụọ. Ana m aṅụrị ọṅụ ịhụ mkpebi unu na iguzosi ike nʼokwukwe unu nʼime Kraịst.