Ọ bụ ọchịchọ m ka unu ghọta otu m si na-agbasi mgba ike nke ukwuu nʼihi unu, na nʼihi ndị nọ nʼobodo Laodisia, na ndị niile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu. Ebumnobi m bụ ka a gbaa ha ume, jikọọkwa ha nʼotu nʼịhụnanya, ka ha nweta ụba niile nke nghọta zuruoke na amamihe nke ihe omimi Chineke ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya. Ọ bụkwa nʼime ya ka ụlọakụ ihe zoro ezo niile nke amamihe na ihe ọmụma dị. Ana m ekwu nke a ka onye ọbụla ghara iji ire ụtọ duhie unu ụzọ. Ọ bụ ezie na anọghị m nʼetiti unu nʼanụ ahụ, ma anọ m nʼetiti unu nʼime mmụọ. Ana m aṅụrị ọṅụ ịhụ mkpebi unu na iguzosi ike nʼokwukwe unu nʼime Kraịst.
Gụọ Ndị Kọlọsị 2
Geere nke a ntị Ndị Kọlọsị 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ndị Kọlọsị 2:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị