ỌLU NDI-OZI 16:25-40
ỌLU NDI-OZI 16:25-40 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị. Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara. Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya. Ma Pọl tiri mkpu nʼoke olu, sị, “Emerula onwe gị ahụ. Anyị niile nọ nʼebe a!” Onyeisi nche ahụ kpọrọ ka eweta ọkụ, ọ gbabara nʼime, daa nʼụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji. Ọ kpọpụtara ha nʼezi sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?” Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.” Mgbe ahụ, ha gwara ya na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya okwu nke Onyenwe anyị. Nʼotu elekere ahụ, nʼabalị ahụ, ọ sachara ọnya ha. Nʼatụfughị oge, ha mere ya na ezinaụlọ ya baptizim. Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke. Nʼechi ya, ndị ikpe ahụ zitere ndị uweojii sị, “Hapụnụ ụmụ nwoke ahụ ka ha laa.” Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl, sị, “na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa. Ugbu a pụtanụ. Unu laanụ nʼudo.” Ma Pọl sịrị ha, “Ha tiri anyị ihe nʼihu mmadụ niile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nʼụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nʼobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesiri ka ha bịa nʼonwe ha kpọpụta anyị.” Ndị uweojii ahụ gara gwa ndị ikpe ahụ ihe ha kwuru. Mgbe ha nụrụ na ha bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu. Ha bịakwutere ha rịọsie ha arịrịọ ike. Ha kpọpụtakwara ha, rịọ ha ka ha hapụ obodo ahụ. Mgbe ha sitere nʼụlọ mkpọrọ pụta, ha gara nʼụlọ Lidia. Nʼebe ahụ ka ha zutere ụmụnna, gwa ha okwu mgbamume, emesịa ha si nʼobodo ahụ pụọ.
ỌLU NDI-OZI 16:25-40 Bible Nso (IGBOB)
Ma dika n'etiti abali Pọl na Sailas nēkpe ekpere nābùku kwa Chineke abù, ndi-nkpọrọ we nēge nti n'olu-ha; na mberede oké ala-ọma-jijiji di, nke mere ka ntọ-ala ulo-nkpọrọ ma jijiji: ngwa ngwa ọnu-uzọ nile we meghe; ab͕u ndi-nkpọrọ nile tọpu-kwa-ra. Onye-nche ulo-nkpọrọ, ebe emere ka ọ teta n'ura, ebe ọ hu-kwa-ra ọnu-uzọ ulo-nkpọrọ ka ha megheworo, o we miputa mma-agha-ya, gaje ib͕u onwe-ya, ebe ọ nēchè na ndi-nkpọrọ ab͕apuwori. Ma Pọl were oké olu ti nkpu, si, Emerula onwe-gi aru: n'ihi na ayi nile nọ n'ebe a. O we riọ ka eweta ọku, o we mabà nime, da n'iru Pọl na Sailas, ka aru nāma ya jijiji, o we kuputa ha, si, Ndi-nwe-ayi, gini di nkpà ka m'me ka ewe zọputam? Ha we si, Kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọputa kwa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi. Ha we gwa ya okwu Onye-nwe-ayi, ya na ndi nile nọ n'ulo-ya. O we kuru ha n'otù oge hour nke abali ahu, sa ọnyá ihe-otiti-ha; ngwa ngwa ewe me ya baptism, ya onwe-ya na ndi-ya nile. O we kugo ha n'ulo-ya, dọba ihe-oriri n'iru ha, obi nātọ kwa ya utọ nke-uku, ya na èzí-na-ulo-ya nile, ebe o kwere Chineke. Ma mb͕e chi bọrọ, ndi-ikpé zitere ndi-ọchi-utari-ha, si, Rapu ndikom ahu ka ha la. Onye-nche ulo-nkpọrọ ahu we kọrọ Pọl okwu ndia, si, Ndi-ikpé ezitewo ka arapu unu la: ya mere putanu ub͕u a, la kwa n'udo. Ma Pọl siri ha, Ha piara ayi ihe n'iru ọra madu, nāmaghi ayi ikpé, ọ bu ezie na ayi bu ndi Rom, ha we tubà ayi n'ulo-nkpọrọ; hà nāchupu kwa ayi ub͕u a na nzuzo? ha agaghi-eme ya ma-ọli; kama ka ha onwe-ha bia duputa ayi. Ndi-ọchi-utari ahu we kọrọ ndi-ikpé okwu ndia: ha we tua egwu, mb͕e ha nuru na ha bu ndi Rom; ha we bia riọ ha; mb͕e ha duputasiri ha, ha we kpere ha ka ha si n'obodo-ha pua. Ha we si n'ulo-nkpọrọ-ahu puta, ba n'ulo Lidia: mb͕e ha husiri umu-nna nime Kraist, ha kasie ha obi, we pua.