Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị. Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara. Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya. Ma Pọl tiri mkpu nʼoke olu, sị, “Emerula onwe gị ahụ. Anyị niile nọ nʼebe a!”
Onyeisi nche ahụ kpọrọ ka eweta ọkụ, ọ gbabara nʼime, daa nʼụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji. Ọ kpọpụtara ha nʼezi sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?”
Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.” Mgbe ahụ, ha gwara ya na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya okwu nke Onyenwe anyị. Nʼotu elekere ahụ, nʼabalị ahụ, ọ sachara ọnya ha. Nʼatụfughị oge, ha mere ya na ezinaụlọ ya baptizim. Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke.
Nʼechi ya, ndị ikpe ahụ zitere ndị uweojii sị, “Hapụnụ ụmụ nwoke ahụ ka ha laa.” Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl, sị, “na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa. Ugbu a pụtanụ. Unu laanụ nʼudo.”
Ma Pọl sịrị ha, “Ha tiri anyị ihe nʼihu mmadụ niile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nʼụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nʼobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesiri ka ha bịa nʼonwe ha kpọpụta anyị.”
Ndị uweojii ahụ gara gwa ndị ikpe ahụ ihe ha kwuru. Mgbe ha nụrụ na ha bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu. Ha bịakwutere ha rịọsie ha arịrịọ ike. Ha kpọpụtakwara ha, rịọ ha ka ha hapụ obodo ahụ. Mgbe ha sitere nʼụlọ mkpọrọ pụta, ha gara nʼụlọ Lidia. Nʼebe ahụ ka ha zutere ụmụnna, gwa ha okwu mgbamume, emesịa ha si nʼobodo ahụ pụọ.