ỌLU NDI-OZI 15:12-21
ỌLU NDI-OZI 15:12-21 Bible Nso (IGBOB)
Ọra ha nile we kpuchie ọnu-ha; ha we nuru okwu Banabas na Pọl ka ha nakọ akukọ ihe-iriba-ama na ọlu-ebube nile, ka ha ra, bú nke Chineke mere n'etiti ndi mba ọzọ site n'aka-ha. Mb͕e ha kpuchiri ọnu-ha, Jemes we za, si, Umu-nnam, nurunu olum: Simeon kọrọ otú Chineke buru uzọ leta ndi mba ọzọ, isi n'etiti ha weputara aha-Ya otù ndi. Nka na okwu ndi-amuma nwe-kwa-ra otù olu; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Mb͕e ihe ndia gasiri M'gālaghchi, M'gāma kwa ulo-ikwū nke Devid ọzọ, nke daworo ada; Ọ bu kwa ebe-ya nile akwaturu akwatu ka M'gēwu ọzọ, M'gēme kwa ka o guzozie ọzọ: Ka ndi fọduru n'etiti madu we chọ Onye-nwe-ayi, Ha na mba nile, ndi aguru aham, Ka Onye-nwe-ayi kwuru, Onye nēme ka amara ihe ndia site na nmalite oge a. N'ihi nka uche nke mu onwem bu, ka ayi ghara isob͕u ndi si n'etiti ndi mba ọzọ chigharikute Chineke: kama ka ayi zigara ha akwukwọ-ozi, ka ha rapu ihe ruru árú nke arusi nile, na ikwa-iko, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ọbara. N'ihi na Moses site n'ọb͕ọ mbu nile nwere n'obodo dum ndi nēkwusa ya, ebe anāgu ya n'ulo-nzukọ nile ubọchi-izu-ike dum.
ỌLU NDI-OZI 15:12-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ. Mgbe ha kwusiri okwu ndị a, Jemis sịrị, “Ụmụnna m geenụ ntị. Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya. Nke a na okwu ndị amụma dakọtara, dịka e dere ya, “ ‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi, aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada. Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa, aga m emekwa ka ọ guzozie, ka ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ nwe ike chọọ Onyenwe anyị, ọ bụladị ndị mba ọzọ niile ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Onyenwe anyị kwuru, onye na-emekwa ihe ndị a.’ Nke a amaara site na mgbe ochie. “Nʼihi nke a, mkpebi ikpe m bụ nke a, ka anyị ghara isogbu ndị mba ọzọ lọghachikwutere Chineke, kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. Site na mbụ, Mosis nwere ndị na-ekwusa iwu nʼobodo niile. A na-agụkwa ya nʼụlọ nzukọ nʼụbọchị izuike niile.”