Ọra ha nile we kpuchie ọnu-ha; ha we nuru okwu Banabas na Pọl ka ha nakọ akukọ ihe-iriba-ama na ọlu-ebube nile, ka ha ra, bú nke Chineke mere n'etiti ndi mba ọzọ site n'aka-ha. Mb͕e ha kpuchiri ọnu-ha, Jemes we za, si, Umu-nnam, nurunu olum: Simeon kọrọ otú Chineke buru uzọ leta ndi mba ọzọ, isi n'etiti ha weputara aha-Ya otù ndi. Nka na okwu ndi-amuma nwe-kwa-ra otù olu; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Mb͕e ihe ndia gasiri M'gālaghchi, M'gāma kwa ulo-ikwū nke Devid ọzọ, nke daworo ada; Ọ bu kwa ebe-ya nile akwaturu akwatu ka M'gēwu ọzọ, M'gēme kwa ka o guzozie ọzọ: Ka ndi fọduru n'etiti madu we chọ Onye-nwe-ayi, Ha na mba nile, ndi aguru aham, Ka Onye-nwe-ayi kwuru, Onye nēme ka amara ihe ndia site na nmalite oge a. N'ihi nka uche nke mu onwem bu, ka ayi ghara isob͕u ndi si n'etiti ndi mba ọzọ chigharikute Chineke: kama ka ayi zigara ha akwukwọ-ozi, ka ha rapu ihe ruru árú nke arusi nile, na ikwa-iko, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ọbara. N'ihi na Moses site n'ọb͕ọ mbu nile nwere n'obodo dum ndi nēkwusa ya, ebe anāgu ya n'ulo-nzukọ nile ubọchi-izu-ike dum.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 15
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 15
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 15:12-21
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo