II. NDI TESALỌNAIKA 3:10-12
II. NDI TESALỌNAIKA 3:10-12 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na mb͕e ayi nọ n'etiti unu, ọ bu kwa nka ka ayi nēnye unu n'iwu, si, Ọ buru na onye ọ bula achọghi ilu ọlu, ya ghara kwa iri ihe. N'ihi na ayi nuru okwu bayere ufọdu ndi nādighi-alu ọlu ọ bula, kama ha nētiye aka n'ọlu nke nābughi nke aka ha. Ma ndi di otú a ka ayi nēnye iwu nāriọ kwa aririọ nime Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka ha were nwayọ nālu ọlu, ri kwa nri nke aka ha.
II. NDI TESALỌNAIKA 3:10-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.” Ma anyị anụla na ụfọdụ nʼetiti unu na-anọ nkịtị na-arụghị ọrụ ọbụla, kama ndị dị otu a na-agagharị, na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha. Ha anaghị arụ ọrụ ọbụla. Anyị na-enye ndị a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, si ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta.