Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. SAMUEL 7:1-29

II. SAMUEL 7:1-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

O ruo mgbe eze nọsara ahụ nʼụlọeze ya, mgbe ONYENWE ANYị mekwara ka o site nʼaka ndị iro ya nọ gburugburu zuru ike, ọ sịrị Netan, bụ onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼime ụlọ ikwu.” Netan zaghachiri eze sị, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi gaa nʼihu mee ya, nʼihi na ONYENWE ANYị nọnyeere gị.” Ma nʼabalị ahụ, okwu ONYENWE ANYị rutere Netan ntị, na-asị, “Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka ONYENWE ANYị kwuru, Ọ bụ gị ga-ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi? Nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta ndị Izrel ruo taa. Kama ana m ejegharị site otu ebe gaa ebe ọzọ, were ụlọ ikwu mere ebe obibi m. Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m Izrel, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?” ’ “Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị. Mee gị onye na-achị ndị m Izrel. Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa. Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha; ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ, dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m enyekwa gị ezumike site nʼebe ndị iro gị niile nọ. “ ‘ONYENWE ANYị na-ekwupụtara gị, na ONYENWE ANYị ya onwe ya, ga-eguzobere gị ụlọ. Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe i ga-esoro nna nna gị ha dinaa nʼọnwụ, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, onye bụ anụ ahụ na ọbara gị, aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. Ọ bụ ya ga-ewuru m ụlọ. Aga m eme ka ocheeze nke alaeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna. Ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Ọ bụrụ na o jehie, aga m eji mkpanaka mmadụ taa ya ahụhụ. Werekwa ihe otiti si nʼaka ndị mmadụ dụọ ya ọdụ. Ma agaghị ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m si wezuga ya site nʼebe Sọl nọ, bụ onye m wezugara site nʼihu gị. Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nʼihu m. A ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ” Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị. Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu ONYENWE ANYị, sị: “Onye ka m bụ, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a? Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị. Ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị, nke a bụkwa ụkpụrụ metụtara mmadụ efu. “Ma gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị? O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị. Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma. Nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ohu gị mata ha. “Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị, lee ka i si dị ukwuu! Ọ dịghị onye dịka gị. Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị. Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa nke Chineke gara ịgbapụta dịka otu ndị nye onwe ya, na iji mere onwe ya aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt? I meela ka ndị gị Izrel guzosie ike, dịka ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Ma gị onwe gị kwa, ONYENWE ANYị, abụrụla Chineke ha. “Ugbu a, ONYENWE ANYị Chineke, debe nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-asị, ‘ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke na-achị Izrel’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị bụ Devid guzosie ike nʼanya gị. “O ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel, nʼihi na ị kpugheerela ohu gị ihe a, na-asị, ‘Aga m ewuru gị ụlọ.’ Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere a. O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị, ị bụ Chineke nʼezie. Okwu gị kwesiri ntụkwasị obi. I kweekwala ohu gị nkwa ihe ọma ndị a. Ugbu a biko, ka ọ masị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ka ọ dịgide nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na gị, o Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị ekwuola ya, sitekwa na ngọzị gị, ụlọ ohu gị ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”

II. SAMUEL 7:1-29 Bible Nso (IGBOB)

O rue, mb͕e eze biri n'ulo-ya, mb͕e Jehova me-kwa-ra ka o zuru ike pua n'aka ndi-iro-ya nile buruburu, na eze siri Netan, bú onye-amuma, Biko, le, Mu onwem nēbi n'ulo cedar, ma ib͕e Chineke nēbi n'etiti ákwà-nkwuba. Netan we si eze, Ihe nile nke di n'obi-gi, je, me ya; n'ihi na Jehova nọyere gi. O rue, n'abali ahu, na okwu Jehova ruru Netan nti, si, Je, si orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu gi onwe gi gēwurum ulo ibu ebe M'gēbi? N'ihi na ebighm n'ulo site n'ubọchi M'mere ka umu Israel si n'Ijipt rigota, we rue ta, kama M'nējeghari n'ulo-ikwū na n'ebe-obibim. N'ebe nile nke M'nējeghari n'etiti umu Israel nile, ọ̀ di okwu M'gwara otù n'ebo Israel nile, nke M'nyere iwu izù ndim, bú Israel, si, N'ìhi gini ka unu newurughm ulo cedar? Ma ub͕u a, otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n'ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n'ebe i nēso ìgwé ewu na aturu, kuru gi, ka i buru nye-ndú ndim, bú Israel: M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha uku, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa. M'gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otú ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n'ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eweda kwa ha ọzọ, dika na mbu, na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel; emewokwam ka i zuru ike pua n'aka ndi-iro-gi nile. Jehova egosiwo kwa gi na Jehova gēmere gi ulo. Mb͕e ubọchi-gi zuru, mb͕e gi gēsoro nna-gi-hà dina kwa n'ọnwu, M'gēme kwa ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, nke gēsi n'afọ-gi puta, M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike. Onye ahu gēwuru aham ulo, M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe ya gābu-kwa-ram nwa: ọ buru na ọ me ajọ omume, M'gēwere nkpa-n'aka madu, were kwa ihe-otiti nke umu madu, dua ya ọdu; ma eberem agaghi-esi n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya, dika M'wēzugara ya n'ebe Sọl nọ, onye M'wezugara n'iru gi. Ma ulo-gi na ala-eze-gi gēkwesi ntukwasi-obi n'iru gi rue mb͕e ebighi-ebi: agēme ka oche-eze-gi buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi. Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu. Eze, bú Devid, we ba, nọdu ala n'iru Jehova; ọ si, Ònye ka m'bu, Onye-nwe-ayi Jehova, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m'biarue na mb͕e a? Ma nka bu nání ihe ntà n'anya-Gi, Onye-nwe-ayi Jehova; I we kwu kwa okwu bayere ulo-orú-Gi rue mb͕e di anya; nka bu kwa iwu bayere madu, Onye-nwe-ayi Jehova! Ma gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ? n'ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi, Onye-nwe-ayi Jehova. N'ihi okwughi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka orù-Gi mara ya. N'ihi nka I di uku, Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi. Ma òle mba di ka ndi-Gi, dika Israel, bú otù mba nke nēguzo iche n'uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ka ọ buru otù ndi, na imere Onwe-ya aha, na imere unu ihe-idi-uku a, na imere ala-Gi ihe di egwu, n'iru ndi-Gi, nke I siri n'Ijipt, bú mba di iche iche ọzọ na chi nile ha, baputara onwe-gi? I we me ndi-Gi, bú Israel, ka o guzosiere Gi ike, iburu Gi otù ndi rue mb͕e ebighi-ebi; Gi onwe-gi, Jehova, we ghọrọ ha Chineke. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, me ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo. Ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu Chineke Israel: agēme kwa ka ulo orù-Gi, bú Devid, guzosie ike n'iru Gi. N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, I kpughewo nti orù-Gi, si, M'gēwu-kwa-ra gi ulo: n'ihi nka orù-Gi nwetara obi-ike ikpere Gi ekpere a. Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi Jehova, Gi onwe-gi bu Chineke onwe-ya, okwu-Gi nile bu kwa ezi-okwu, I gwawo kwa orù-Gi ezi ihe a: ma ub͕u a kwere igọzi ulo orù-Gi, ka o we dirue mb͕e ebighi-ebi n'iru Gi: n'ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi Jehova, ekwuwo ya: ka ewere kwa ngọzi-Gi nāgọzi ulo orù-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.